Lee otu agha nnupuisi dị iche iche na-achọ iwere ọchịchị na mba Haiti

Foto Guy Philipe e nwebụrụ mbụ, Jimmy Cherizier na Johnson André

Ebe foto si, Reuters (L,L) and YouTube (R)

Nkọwa foto, Guy Philipe (n'aka ekpe) bụbụ onye nnupuisi na Jimmy Chérizier onye nnupuisi nakwa Johnson André ndị socha na-eme ndọrọndọrọ ịbụ onyeisi ndị nnuisi
    • Onye dere ya, By Vanessa Buschschlüter
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Online Latin America & Caribbean editor

Onye uweojii n’oge ochie bụ onye na-enwe mmasị ịkpọ ọgbakọ ndị ntaakụkọ dịka ọ na-ebugharị egbe ya na obere onye omekoome na-enwe mmasị ịpụta n’ihe onyonyoo egwu ‘rap’ n’ebe ọ na ọ na-atụ mgbere ngwaagha na ọgwụ ike.

Ndị a bụ naanị mmadụ abụọ n’ime ndị ndu agboro a na-ata ụta maka tigbuo zọgbuo na-arị elu n’isi obodo Haiti bụ Port-au-Prince nke mere ka onye Praịm Minista Haiti bụ Ariel Henry gbaa arụkwaghịm.

Gbakwunye ya onye bụụrụ onye agha nnupụisi ka si n’ụlọmkpọrọ pụta na mba Amerịka ma na-eme atụmatụ ị bụ onyeisiala, ị ga-enwetazi mpụ na arụrụala.

Dịka obodo ahụ gbanyere aka n’ukwu na-eche maka nhiwe gọọmenti nchereoge, anyị chọrọ ị mata ụfọdụ ndị na-agba mbọ inweta ọkwa ọchịchị mba Haiti nke ọma.

Ị ma maka onye ndu ndị nnupuisi bụ Jimmy ‘Barbecue’ Chérizier

Former police officer Jimmy 'Barbecue' Cherizier, and leader of an alliance of armed groups, uses a walkie talkie after addressing the media, in Port-au-Prince, Haiti, 11 March 2024

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Jimmy ‘Barbecue’ Chérizier bụ onye ndu ndị agboro pụtara ihe karịsịa mana ndị ọzọ kasị nwee ndị bu ngwa agha na-eso ha n’azụ

Onye ahụ gbara afọ 47 ma bụrụkwa onye uweojii n’oge ochie nwere ike ọ bụghị ya bụ onye ndu ndị agboro kachasị ike mana Jimmy Chérizier bụ onye a kachasị ahụ anya n’ọgbaaghara ndị a na-ahụta na nso nso a.

Onye ihe eji mara ya bụ ịgwa ndị ntaakụkọ okwu n’oge oyi naanị uwe nchemgbọ, nwoke ahụ a maara nke ọma dịka ‘Barbecue’ nọ n’isi otu ndị agboro a na-akpọ G9.

“Barbecue’ abụrụụla otu n’ime ndị iro Ariel Henry na-ekwusi okwu ike, dịka ọ na-akpọ oku ka ọ gbaa arụkwaghịm kemgbe e jiri duo nwoke ahụ n’iyi ọrụ dịka Praịm Minista.

Onye ndu G9 ahụ abụrụla onye e boro ebubo ịnọ n’isi mkpochapụ mmadụ n’afọ 2018 bụ mgbe a nọọrọ gbuo igwe mmadụ, ọ bụkwa ya hụrụ maka mgbochi ọdọ mmanụ ụgbọala ‘Varreux fuel terminal’.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mwakpo ndị otu G9 na-eme megide nkesa mmiri na ihe oriri emeela ka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na mba Haiti husie anya. Ukọ mmanụ ụgbọala mgbochi ahụ butere emeela ka ụlọọgwụ dị iche iche hụsie anya ịhụ na ha gbanyere igwe na-enye ọkụ ha oge niile maka ịlekọta ndị ọnọdụ ha dị njọ.

“Barbecue akpọọla oku ndị na-edoghị anya maka ụkpụrụ ọchịchị nkwụwaakaọtọ na ime ihe nhatanha, mana ebe o si agbagwoju anya bụ na otu ndị na-ebugharị ngwa ọgụ n’isi obodo ahụ nakwa gburugburu ya niile na-ekewapụta ọnọdụ ọjọọ maka mmadụ ndị bi n’ime ya,” ya ka otu onye ọkachamara na mba Haiti bụ Michael Deibert na-akọwa.

Barbecue na-ekwu na ya ejikọtala otu ọjọọ niile a ma ama na-ese okwu na Port-au-Prince ka ha bụrụ otu bụkwanụ nke a kpọrọ Viv Ansanm (Bikọta Ọnụ).

Ọ bụ ihe rara ahụ ịchọpụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Mana dịka na-enwebeghị onye ndu otu ọzọ gọnahụrụ nke a, njikọta ọ bụla bụ nke a na-atụ anya na ọ gaghị anọte aka, dịka Michael Deibert siri kwuo.

“Otu ndị a na-ebuso onwe ha iro na-eleghị anya n’azụ oge niile,” ya ka nwaamadị ahụ bụ onye ntaakụkọ, odeakwụkwọ na onye na-eme nchọnchọ na University Institute of Lisbon (ISCTE) na-akọwa.

Maazị Deibert na-ekwu na ọ bịara dị ka otu ndị ahụ achọtala ụkpụrụ ọzọ ha si eme ihe dịka ha na-agba mbọ ibibi obodo ahụ. “Nke m na-amaghịkwanụ ihe kpatara ya,” ka ọ gbakwunyere.

Dịka ọ nọ na-ekpori mgbe, Barbecue nọọrọ n’ime izuụka gara aga dọọ aka na ntị na agha ime nwere ike itiwapụ ọ bụrụ ma Maazị Henry lọghachi Haiti. Onye ndu otu G9 ahụ ekwubeghị okwu ọzọ kemgbe Maazị Henry kwuru na ya ga-agbatu n’ọkwa ngwangwa ehiwechara otu kaụnsul nnyefe ọchịchị.

Mana ọ bụrụ ma elekwasa anya n’ịdọ aka na ntị o nyere na mgbe gara aga sị na e kwesịrị ịhapụ ụmụafọ Haiti ka ha jiri aka ha kpebie etu ha chọrọ i si mee ihe na-enweghị ntụnyeoke mba ndị ọzọ, atụmatụ a na-eme iziga ndị ọrụ nchekwa si mba dị iche iche na Haiti agaghị adabara ya.

Roman Le Cour, onye ọkachamara n’otu Global Initiative against Transnational Organized Crime (GI-TOC), na-ekwu na Barbecue na-enweta ọtụtụ ikikere ya site n’ilekọta ọdọ mmiri na ọdọ mmanụ ụgbọala dị n’isi obodo ahụ.

Ya bụrụ ma ezigaa ndị uweojii ọha mba ụwa ka ha gaa weghara akụrụngwa ndị a gbara ọkpụrụkpụ, Barbecue nwere ike ihụta ka ikikere ya ga-esi nwụọ, ya ka Maazị Le Cour na-esi arụmarụ.

Ma Maazị Le Cour ma Maazị Deibert dọrọ aka na ntị na Barbecue abụghịdị onye ndu otu ndị agboro ikikere ya kasị elu na mba Haiti, kama ọ bụ onye nke ndị ọrụ mgbasaozi na-agaru nso.

“Ọtụtụ n’ime ndị nwere nnukwu ikikere bụ ndị na-adịghị enye ndị ntaakụkọ ohere ịgba ha ajụjụ,” ya ka Maazị Deibert rụtụrụ aka.

Ị nụla maka onye ndu ndị otu nnupuisi ọzọ bụ Johnson André, onye a maara nke ọma dịka Izo

Foto e si n'onyoonyo egwu na YouTube sepụta

Ebe foto si, YouTube

Nkọwa foto, Izo bụ otu n’ime ndị ndu otu agboro onye ikikere ya nọọrọ na-arị elu

Otu n’ime ndị ndu otu agboro echere na o nwere ikikere karịa Barbecue bụ nwaokorobịa gbara afọ 26 a maara dịka Izo.

Izo dị iche n’ebe Barbecue nọ, ọ bụbu onye uweojii, nke pụtara na o sitere n’ụkpụrụ ọchịchị otu ahụ pụta idu otu Vilaj de Dye - 5 Segonn, ya ka Roman Le Cour na-akọwa.

Ndị ndu otu abụọ ahụ na-apụta ihe, mana Izo na-eji ọba ozi Social Media ezipụ ihe onyonyoo egwu karịa ikwupụta echiche ya n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Nwata agboro ahụ ewepụtala ụfọdụ ihe onyonyoo egwu rap ọ bụladị ka Youtube nyere ya onyinye maka inweta mmadụ otu narị puku (100,000) na-eso ya.

Mana ihe nọ n’ime onye agboro ahụ kpuchiri onwe ya bụ ajọ onye omekoome, onye ndị otu ya na-etinye aka n’ịkwaso mmadụ iko n’ike, ntọrọ, ịtụ mgbere ngwa agha na ọgwụ ike, dịka otu mba ụwa siri kwuo.

A na-ebokwa ya ebubo ịgbochi oru enyemaka.

Roman Le Cour bụ onye nọ kemgbe na-atule otu ndị agboro Haiti kemgbe afọ ndị gara aga kwuru na ihe mere Izo jiri pụọ iche bụ n’ihi na ọ gbalịrị nweta ikikere ilekọta okpo mmiri e nwere na Port-au-Prince.

Nke ahụ na-enyere ya aka iji ụzọ aghụghọ gbanahụ okeala mba ahụ otu agboro ndị ọzọ jichiri ma na-anyekwara ya aka ibugharị ngwa ọgụ ngwangwa.

Dịka otu mba siri kwuo, Izo gbakwasara ụkwụ “n’ọnọdụ nchekwa Haiti dakpọrọ adakpọ” iji na-akpa ego site n’ịtụ mgbere ọgwụ ike tinyekwara ụfọdụ ngwaahịa e kwuru sitere Saụt Amerịka lọbata n’ogbe ọ na-achịkọta bụ Vilaj de Dye.

N’ozi o wepụtara banyere ọgbaaghara otu ndị agboro mba Haiti, otu Global Initiative against Transnational Organized Crime (GI-TOC), chọpụtara mbọ Izo gbara ịgbasakwu ebe ndị ọ na-achịkọta fere n’isi obodo mba ahụ.

Dịka ndị otu ya jiiri anya ike banye na Mirebalais, nke nọ kilomita 35 na mpaghara ugwu nke isi obodo mba ahụ, o butere ọgbaaghara ọjọọ n’etiti ndị otu ya bụ 5 Segonn na ndị nche obodo bụ ebe a nọọrọ gbuo mmadụ 30. Dịka akụkọ ahụ siri kọọ, opekata mpe ezinaụlọ 800 gbahapụrụ ụlọ ha rie mbọmbọ n’ihi ọgbaaghara ahụ.

Maazị Le Cour rụtụrụ aka na ngalaba ịtụ mgbere ọgwụ ike na ngwa agha Izo bụ nke ga-ata ezigbo akpụ ịkụkasị dịka ha dị obosara, nke na ịresị ndị iro ya ngwaagha anaghị emetụ ya n’ahụ.

Kedụ onye bụ Guy Philippe; onye agha nnupụisi n’oge ochie?

Guy Philippe mgbe ya na ndị Reuters na-enwe mkparịta na Zoom

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Guy Philippe, onye ndu ndị agha nnupụisi mechara bụrụ onye na-egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, gwara ụlọọrụ mgbasaozi Reuters na ya chọrọ ị bụ onyeisiala

N’afọ 2016, ọ zọrọ ọkwa sịnetọ na Haiti ma turu ugo mmeri.

Mana mkpụrụ ụbọchị ole ma ole tupu eduo ya n’iyi ọrụ - nke gaara ekpuchite ya n’ekpemiikpe - anwụchiri ya n’ihi ebubo ịtụ mgbere ọgwụ ike ma kpọlaa ya mba Amerịka.

O kwetara ịnara aka azụ maka ikpuchite ọgwụ ike atụgara mba Amerịka n’oge ọ nọ n’ọrụ dịka onye uweojii ọkwa ya dị elu.

Akpọghachitere Philippe mba Haiti n’ime ọnwa Nọvemba dịka ọ nọsịrị afọ mkpọrọ ya, nzọpụ njem Michael Deibert kọwara dịka “ịwụnye mmanụ fuel n’ọkụ.”

O weghị Philippe ogologo oge ịmalite nkesa ihe onyonyoo vidio n’ọba ozi social media bụ ebe nọọrọ kpọọ oku nnupụisi megide Maazị Henry.

Guy Philippe ekwupụtala mmasị o nwere ị bụ onyeisiala mba Haiti n’ihu ọha.

N’oge a jụrụ ya ma mkpọrọ ọ gara o nere ike ibute mkpọbiụkwụ nyere ọchịchọ obi ya ị bụ onyeisiala, ọ sịrị “[Onye bụụrụ onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Nelson Mandela] bụụrụ onye gara mpọrọ. [Onyeisiala mba Venezuela n’oge ochie bụ Hugo Chávez] gara mkpọrọ. [Onyeisiala mba Brazil bụ Luiz Inácio Lula da Silva] gara mkpọrọ….. Ya mere, ọ bụrụ ma ndị obodo m nwee ntụkwasaobi ma kwenye n’ime m, a ga m a bụ onye ndu ha. Ọ dịịrị ndị nke m ikpebi, enweghị onye ọzọ.”

Maazị Deibert rụtụrụ aka na Philippe abụghị naanị onye gosirila mmasị ya ị bụ onyeisiala na-agbanyeghị ọnọdụ ọgbaaghara otu agboro dị iche iche butere na mba ahụ.

“Otu otu ọ dị ka echefuru n’ebe a bụ ụmụafọ Haiti,” ya ka o kwuru, dịka ọ rụtụrụ aka n’ọnọdụ ọgbaaghara nke mere ka ihe ruru mmadụ nde ise n’ime ụmụafọ mba Haiti ruru mmadụ nde 11 bụrụ na-ebi ndụ n’oke agụụ.