America/China Relations: Chaina amachiela ụfọdụ ndị ọchịchị Amerịka ịbata mba ha

Joe Biden na Xi Jinping

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ọchịchị mba Chaịna amachiela ụfọdụ ndị welitere isi na gọọmentị mba Amerịka ịbata na mba ha.

Ha mere nke a iji megwara ihe Amerịka mere ịmachị ụfọdụ ndị welitere isi na Chaịna ịbata Amerịka.

Chaịna kwuru na ha na-amachi ndị ọchịchị Amerịka ahụ n'ihi na ha tụtụ asị megide Chaịna.

Cheta na n'izuụka gara aga ka ode akwụkwọ gọọmentị Amerịka bụ Antony Blinken kwuru na Chaịna na-emegide ikike dịịrị mmadụ, ma na-achọkwa ikpochapụ ndị bi na mpaghara Xinjiang.

Nke a mere Amerịka ji wepụta ntaramahụhụ, nke bụ ịmachi ụfọdụ ndị ọchịchị Chaịna ịbata Amerịka.

Mana Taa bụ Tọzde, Maachị 31, ka Chaịna kwuru na ihe niile ahụ Amerịka na-ebo ha bụ ebubo ụgha, ma kwukwaa na ha amachikwaala ndị ọchịchị Amerịka ụfọdeụ ịbata Chaịna.

Oteela mba abụọ a bụ Amerịka na Chaịna ji enwe nghọtahie, mana ọ dịka ya bụ nghọtahie akawanyela njọ ugbua.

N'ọdị nso a, onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden na ogbo ya nke Chaịna bụ Xi Jinping nwere mkparịtaụka n'ekwentị, ebe ha nọrọ kpaa etu a ga-esi mee ka udo chịa n'etiti Russia na Ukraine.

Mmiri eriela mmadụ 12 gunyere ụmụaka isii na-agba ọsọ 'Bandits'

Ndị njem ụgbọmmiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A matabeghi ihe butere okpukpu ụgbọmmiri riri mmadụ ụmụaka mana nke a bụ ihe na-emekarị n'ihi oke ibu.

Mmiri eriela ihe karịrị mmadụ iri na abụọ nke gụnyere ụmụaka na ụmụ nwaanyị dịka ụgbọ mmiri ha kpuru mgbe ha na-agba ọsọ ndụ ịgbalahụ ndị omekome a kpọrọ 'bandits' na Bekee na Niger Steeti.

Ndị ọrụ gbata gbata na-ekwu na-agụpụtala ozu mmadụ asatọ nke ụmụnwaanyị abụọ na umụaka isii ebe mmadụ ise ka na-efu efu.

Ndị ọrụ gọọmentị ọ dị n'aka kwuru na, na-agbanyeghị na ụfọdụ ndị nọ n'ụgbọ ahụ zọtara ndụ ha, ụgbọmmiri a kpuru n'ihi na o bu ibu karịrị ya.

Ọ bụ mgbe ndị omekome a wakporo obodo Galkogo ka ndị a bidoro ịgba ọsọ ndụ n'ụbọchị Tuzde.

Cheta na ndị omekome a wakooro ndị ji ụgbooloko eme njem n'Abuja n'ụbọchị Mọnde were tọọrọ ma gbuo ndị mmadụ na ya bụ mwakpo.

Ndị omeiwu Naịjirịa ga-enyeocha ihe butere mmeri ndị Super Eagles

Samuel Chukwueze

Ebe foto si, DANIEL BELOUMOU OLOMO

Nkọwa foto, Samuel Chukwueze

Ndị omeiwu Naijirịa ekwuola na ha ga-eme nnyocha ihe mere e jiri merie ma gbapụ ndị otu bọọlụ 'Super Eagles' nke Naijirịa n'asọmpị itozu ịzọ iko mba ụwa nke afọ 2022.

Onyeisi omeiwu n'ihe gbasara egwuregwu bụ Obinna Ogba kwuru sị, " Ọ bụ ihe mwute. Anyị ga-eme nnyochi ziri ezi iji mata ihe mere. Agaghị m ebido ibo onye ọbụla si na ọ bụ ya gbatara ya."

Ọ gara n'ihu sị,"Ọtụtụ ihe ka anyị ga-atule, ebe ọkcha wutem bụ ndọrọndọrọ ọchịchị n'etiti ndị na-ahazị Super Eagles. Anyị nweta nzụkọ ndị na ahazị Super Eagles nke ọma, ihe ga-adị mma'.

Ogba kwuru na oge eruola ibido inyocha ndị na-agba bọọlụ na Naijirịa ma site ebe ahụ kwalite ụmụaka na-eto eto chọrọ ịgba bọọlụ.

Austin Eguavoen arịtuola n'ọkwa ya dịka onye nkuzi otu Super Eagles

Austin Eguavoen

Ebe foto si, NFF/Facebook

Austin Eguavoen arịtuola n'ọkwa ya dịka onye nkuzi ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa a na-akpọ 'Super Eagles'.

N'otu aka ahụ kwa, ngalaba nhazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ 'Nigeria Football Federation' chụkwara ndị niile ha na Eguavoen so rụọ ọrụ.

Nke a na-abịa dịka ndị 'Super Eagles' gbachara ọnyụpa oge ha na ndị 'Black Stars' nke Ghana zutere n'asmpi itozu oke maka iko mba ụwa nke afọ 2022.

Ghana na Naịjirịa gbara nhatanha site n'inye onwe ha otu goolu otu goolu, mana ọ bụ ndị Ghana tozuru ịga asọmpi iko mba ụwa n'ihi iwu Fifa tinyere a na-akpọ 'away goals rule'.

Cheta na Naịjirịa enyetaghị goolu n'asọmpi nke mba abụọ a gbara na Kumasi Ghana, n'ụbọchị 25 nke Maachị, mana Ghana nyetara otu goolu n'Abuja na Maachị 29, 2022.

Ihe mere Austin Eguavoen ji rituo

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Eguavoen malitere ọrụ dịka onye nkuzi ndị 'Super Eagles dịka ndị NFF chụpụrụ Gernot Rohr na ya bụ ọrụ.

Ọ bụ Eguavoen duuru ndị Super Eagles gaa asọmpi iko mba Afrịka a gbara na Kameroon n'ọnwa Jenụwarị afọ 2022.

Ndị 'Super Eagles' meriri asọmpi atọ ha gbara na ya bụ iko mba Afrịka, mana ndị Tunisia gbapụrụ ha n'agba nke abụọ.

Nke a mere ka NFF nye Eguavoen na ndị nkuzi ibe ya iwu na ha ga-emeriri asọmpi iji tozuo oke iso n'iko mba ụwa nke a ga-agba na mba Qatar n'ọnwa Nọvemba 2022.

Mana mba dịka mba Ghana meriri ma gbapụ ndị Super Eagles na ya bụ asọmpi, ọ pụtara na ha akụọla afọ n'ala nke ugboro abụọ.

Ọ bụ nke a mere Eguavoen ji wụsa ọwa ma riyuo n'ọkwa ya dịka onye nkuzi ndị 'Super Eagles'.