Buhari ekelela Xi Jinping maka e megharịrị ya onyeisiala China

Xi jingping

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Xi kwesiri iritu n'afọ 2023 mana nke agaghị emezi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Femi Adesina dere akwụkwọ ozi degara onyeisiala mba China bụ Xi Jingping taa maka na e megharịrị ya onyeisiala mba ahụ.

Adesina kwuru na Buhari jiri aka binye aka n'akwụkwọ ozi ekele ahụ o zigara Xi.

O kwuru na Buhari toro onyeisiala mba China maka amamihe na ụdị ọdịnaihu o nwere maka China.

Ụlọọrụ onyeisiala Buhari depụtakwara ozi ekele ahụ n'igwe mgbasa ozi Twitter taa.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'akwụkwọ ozi ekele Buhari dere, o kwupụtara olileanya ya na Naịjiria na China ga-aga n'ihu na-enwe ezi mmekọrịta.

Cheta na otu pati Communist nke Xi nọ na ya gbanwere iwu China iji mee Xi onyeisiala mba ahụ rue n'ọnwụ.

Kemgbe 1990, iwu China kwuru na ọ bụ naanị ugbo abụọ ka onyeisiala China ga-anọ n'ọkwa.

Mana Xi, bụ onye kwesiburu ịrịtụ n'afọ 2023, akpọpụtala onye ga-anọchị ya mgbe pati na-achị China nwere nnọkọ a n'ọnwa Ọktoba 2017.

Iwu a emegharịrị ga-enye Xi Jinping ohere ịnọdu ka onyeisiala karịa ugboro abụọ o kwesịrị ịnọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: