Coal Camp fire: Etu Colliery Avenue dị ugbua kemgbe izu abụọ ọkụ gbachara

A malitela ịrụgharị ebe obibi ndị ọkụ gbara ụlọ na ngwongwo ha na Colliery Avenue dị na Coal Camp, Enugwu.
Kemgbe ọkụ ahụ gbachara n'ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022, ndị bi n'ogbe ahụ kwara arịrị na ha enwetabeghi enyemaka ọbụla n'aka gọọmentị n'agbanyeghi na ha kwere nkwa ịgbatara ha ọsọ enyemaka.
Ha kwuru na ndị ụlọọrụ na-ahụ maka gbatagbata na Naịjiria bụ National Emergency Management Agency (Nema) na gọọmentị bịara dekọrọ aha ha mana ha anụbeghi ụkpọrọ ha.
Mgbe BBC Igbo gara njem nleta ebe ahụ n'ụbọchị Fraịde, 18 nke ọnwa Febrụwarị 2022, ha hụrụ ka ụfọdụ ndị bi ebe ahụ ji aka ha arụgharị ebe obibi ha.
Ndị ọzọ gwara BBC na ha ka na-arahụ n'ezi, ebe ụfọdụ kwuru na ha gara nọnyere ụmụnne na ndị enyi ha.
BBC kpọtụrụ ụlọọrụ Nema, ndị kwuru na ha gara ebe ahụ n'ezie mana ha ezigala aha ndị ahụ n'isi ụlọọrụ ha ebe a ga-esi gbatara ha ọsọ enyemaka mgbe a hazichara ihe.
Major James Eze bụ onyeisi na-achịkọta Nema na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'Enugwu steeti, kwuru na enyemaka nke ha bụ nke si na gọọmentị etiti, na ọ bụ State Emergency Management Agency (Sema) ga-ebu ụzọ gbata ya bụ ọsọ enyemaka tupu nke gọọmentị etiti abịa mgbe a hazichara ya.
BBC Igbo nwara inweta onyeisi Sema n'Enugwu, mana ruo mgbe e biputara akụkọ a, o bughi ekwenti ya.
Lee ihe BBC hụrụ nakwa ihe ndị bi ebe ahụ kwuru n'onyonyo:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post




Cheta na ọkụ bu ụzọ gbaa na mpaghara a kpọrọ Calabar street dị na Coal Camp n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị 2022,
Ya bụ ọkụ mebiri ọnụ ụlọ karịrị iri abụọ, ma gbapịa ngwongwo ndị e ji ebi n'ụlọ.
Ka ọ dị ugbua, ndị Calabar street na onwe ha ka na-ebe akwa ọkụ a gbara na nke ha.









