Yaba Building Collapse: Azọpụtala mmadụ abụọ ma gwupụta ozu mmadụ atọ n'ụlọ dara na Yaba

Ebe foto si, Chigozie Ohaka
Ndị ọrụ gbatagbata nke Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) ekwuola na ha egwupụtala ozu mmadụ atọ ma zọpụta mmadụ abụọ tọrọ n'ụlọ dara na na 16 Akanbi Crescent, Onike, Yaba, Legọs steeti n'ụbọchị Satọdee.
Ihe a mere n'ihe dịka elekere atọ nke ehihe Satọde bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Febụwarị, 2022.
Amabeghi ihe kpatara ọdịda ụlọ a mana gọọmentị Legọs steeti kwuru na ha anwuchịela oney nwe ya bụ ụlọ dara.
Ndị ọrụ gbatagbata abịaghị n'oge dịka ọ gafere otu awa tupu ha bịa, mgbe ha bịara ha ejighi akụrụngwa ha ji arụ ọrụ.
Ndị nọ ebe ahụ malitere ịgba mbọ izọpụta ndị a sị tọrọ n'ime ụlọ ahụ dara.
Ndị ọrụ gbatagbata nke Lasema mechara bịa ebe ahụ ma malite ọrụ mgbapụta.

Ebe foto si, Screenshot
Kedụ ihe ndị nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere kwuru?
Ndị nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere gwara BBC na ụfọdụ ndị mmadụ nọ n'okpuru ya bụ ụlọ mgbe ọ dara.
Ụfọdụ kwukwara na ha nụrụ olu ụfọdụ ndị mmadụ nke si n'okpuru ụlọ ahụ na-arịọ ka enyere ha aka.
N'abali Satọdee ndị ọrụ gbatagbata Lasema gbara ama na ha gwupụtara ozu mmadụ atọ ebe ahụ.
Ruo ụbọchị ụka ndị Lasema ka nọ ebe ahụ n'ọrụ ha dịka a na-eche na ndị mmadị ka tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ.
Gịnị ka gọọmentị Lagọs steetị na-ekwu maka ụlọ a dara?
Gọọmentị Legọs steeti kwuru na ha anwụchịela onye nwee ụlọ, nke dị na 16 Akanbi Crescent, Onike, Yaba.
Ha kwuru na anwụchịrị ya maka na ọ dara iwu gọọmentị nyere maka ịrụ ụlọ.
Akụkọ na-ekwu na gọọmentị nyere iwu ka akwụsị ịrụ ya bụ ụlọ n'oge gara aga n'ihi nnyocha ha gosiri na ụlọ ahụ agaghị achịta aja.
Kọmịshọna na-ahụ maka ịrụ ụlọ na ọrụ mmepe obodo na Legọs steeti bụ Idris Salako kwuru na nnyocha ngalaba Legọs na-enye ndị na-arụ ụlọ ikikere bụ Lagos State Building Control Agency nyere iwu ugboro abụọ n'afọ 2021 ka akwụsị ịrụ ya bụ ụlọ mana onye nwee ya erubeghị ya bụ iwu isi.
Lasema kwukwara na nyocha ha gosiri na ndị na-arụ ụlọ ahụ nọ n'ime ya mgbe ọ dara.
Ndị ọrụ gbatagbata ka nọ ebe ahụ agba mbọ n'ọrụ nzọpụta ndị a ka na-eche tọrọ n'ụlọ ahụ.
Cheta na nke a bụ ọnwa ole m ole otu ụlọ ogogo ya dị 21 dara n'Ikoyi, Legos steeti ebe a sị mmadụ 30 nwụrụ.
Gọvanọ steeti ahụ bụ Babajide Sanwo-Olu tiri iwu ka e jiri ụbọchị atọ rie ujo nye ndị a nwụrụ.
Sanwo-Olu kwukwara ka hibe otu nyocha ga-esi imi n'ala sipụta etu ụlọ ahụ si daa.
Akụkọ ka na-abịa

Ebe foto si, Reuters
Ndị nghararịiwe na Kanada akpọọla ekwo nkụ agbanyeghị iwu ụlọikpe
Ndị ọkwọ ụgbọala ogologo bụ 'truck' na Bekee akpọọla ekwo nkụ n'ime ngagharịiwe ahụ ha malitere kemgbe ịzuụka abụọ gara aga, agbenyeghi iwu ụlọikpe nyere ka ha kwụsị ya bụ abụbụ ọrụ n'okeala Amerika na Kanada.
Ụlọikpe nyere ya bụ iwu n'elekere asaa n'abalị Fraịde, mana ruo ugbua, ọtụtụ n'ime ha nọkwa ebe ahụ ka ọnweghị ihe na-eme.
Ndị ọkwọ ụgbọala ndị ahụ ji ụgbọala ha gbochie ụzọ isiakwa mmiri Ambassador Bridge, bụ ụzọ jikọtara Windsor, Ontario, Detroit na Michigan nke bụ na ọnweghị ndị ọzọ ha kwere gafe.
Ndị ọzọ sokwa na ya bụ abụbụ maka ya bụ mmanya a chọrọ ịmanye ndị drịava ahụ ka ha gbaa ọgwụ mgbochi nọkwa ebe ndị ọzọ dịka Ottawa.
Ndị wegara ya bụ ikpe n'ụlọikpe bụ ndị steeti Windsor na ndị otu na-azụ ahịa akụrụngwa ụgbọala bụ ndị na-ekwu na ihe ha tufugoro maka ya bụ abụbụ ọrụ eruola nde dọla iri ise ($50m) kwa ụbọchị.
Ya bụ iwu ụlọikpe mere ka ndị uweojii Windsor mee ka ndị mmadụ mata na "ọ bụ arụ ịkachị ntị na-eme ya bụ abụbụ ọrụ" maọbụ igbochi ụzọ n'okeala ahụ.
Ha mekwara ka ndị mmadụ mata na ndị dara iwu a nwereike ha agaghịzị abata mba Amerịka ma akpachikwa ụgbọala ha.
Mana ka awa ole maọbụ ole gachara, ụfọdụ n'ime ha pụtakwara fegharịwa ọkọlọtọ ha ebe ha na-eme abụbụ ọrụ.
Puku kwuru puku ndị ọzọ nọkwa n'ime obodo Ottawa, isiobodo mba ahụ na-emekwa nke ha.
Ha gbachikwara ụzọ abụọ ndị ọzọ e si eji mba Amerịka.
Mba Russia nwereike ịmalite mnwakpo mgbe ọbụla

Ebe foto si, European Pressphoto Agency
Mba Germany dịka mba Amerịka adọọla ndị be ha nọ n'Ukraine aka na ntị ọzọ ha si ebe ahụ gbapụ tupu abalị abụọ agacha, maka na Russia nwereike ịwakpo ebe ahụ mgbe ọbụla.
Ha kwuru ụbọchị Frịade na ya bụ nmwakpo nwereike iji agha ụgbọelu malite nke nwereike ime ka ọ hịaahụ mmadụ ịgbapụ.
Moscow ka na-agọsi ike na ọnweghị mgbe ha bu n'obi ịwakpo Ukraine agbanyeghị na ndị agha ha ruru otu narị puku keziri nkwụcha n'okeala ha na Ukraine.
Ndị mba ọzọ dịka UK, Canada, the Netherlands, Latvia, Japan na South Korea agwakwala ndị be ha ka ha si ebe ahụ gbapụ ọsọ ngwangwa.
Minista na-ahụ maka mba ofesi nke Russia ebola ndị mba ndị ọzọ a na ha na-arafụ ndị mmadụ site n'ibu akụkọ ụgha.
Onye ndụmọgbụ gbasara ọrụ nchekwa na mba Amerịka bụ Jake Sullivan sị na Russia " ekeela nkwụcha ugbua ibuso agha nke dị egwu".
Ọ sị. "anyị amabeghị ihe ga-eme echi. Anyị amaghị ihe echi ga-abụ. Mana ihe anyị ma bụ na ya bụ oke mmiri ejiela n'igwe nke bụ na onye obula kwesiri ịgbawa ọsọ ndụ ya ugbua".
Sullivan sị na ha amabeghị ka onyeisiala mba Russia bụ Vladimir Putin ekpebiela ịwakpo Ukraine, ma sịkwa na onyeisiala ahụ na-achọzị ihe ọ ga-ekodo aka nwere malite ya bụ mnwakpo nke ọ sịrị ga-amalite n'agha elu.
Okwu ya bịara dịka mba Amerịka dọgoro aka na ntị maka ngwaagha ndị Russia na-ebusa na okeala ha na Ukraine kemgbe izu gara aga ya na ọzụzụ ndị agha ha na-eme na Black Sea nsonso a.
Odeakwụkwọ ukwu mba Amerịak bụ Antony Blinken ekwubụọla na etu Russia si ebusa ngwagha n'okeala ha na Ukraine nyere "nsogbu ma nwekwaike ịme ka ya bụ okwu ria elu".










