Ikoyi building collapse Lagos:Ndi nwụrụ n'ụlọ elu dara n'Ikoyi Legọs eruola 45

Ebe foto si, AFP
Ndị ọrụ gbatagbata ka na-agba mbọ ịzọpụta ndị tọọrọ n' ụlọelu ogogo iri abụọ na abụọ dara n'Ikoyi dị na Legọs
Na Wednezde bụ ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba, azọpụtala mmadụ abụọ nke bụtere ọnụ ọgụgụ ndị ozu ha si n'ime ulọ ahụ pụta 45.
N'otu aka ahụ, gọọmentị Legọs na-ekwu na ọ bụghị eziokwu na ha nwere atụmatu ịkwatu ulo elu abụọ ndị ọzọ ka dị n'ebe ahụ ụlọ a dara.
Ọ bụ otu onye na-arụ ha atọ n'otu ugboro.
Kọmịshọna na-ahu maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Gbenga Omotoso kwuru nke dika ọ na-enye mpụtara mbo ha na-agba n'ụlọ ahụ.

Nke a na-abịa dịka ihe mberede pụrụiche zutere ndị na-arụ ọrụ n'ụlọelu nọ n'ụzọ Gerard, n'Ikoyi, Legọs steeti, n'ụbọchị Mọnde, ụbọchị mbụ n'ọnwa Nọvemba.
Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ otu narị (100) nọ n'ime ụlọelu ahụ ruru ogogo iri abụọ na otu (21) mgbe ọ dara.

Ndị ọrụ gbatagbata ụlọọrụ National Emergency Management Agency (Nema) nke Legọs steeti wụchiri inyere aka n'ịgbapụta ndi tọrọ n'ụlọ ahụ dara ada.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo bụ Chiagozie Nwonwu si hụ, ndị agbataobi dị nso gwara ya na ndị tọrọ n'ime ụlọelu ahụ ugbua na-akpoku ndị be ha, na ndị agbata obi ha nakwa ndị ọrụ nchekwa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ kwuru na ihe a mere ebe elekere mbụ nke ehihie taata.

Kirie ka ọsọ enyemaka mgbapụta ha si aga ugbua:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Akụkọ kwuru na agụpụtara otu onye, mana amaghị ma ọ dị ndụ maka na ọ naghị emegharị ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbatagbata nke Legọs steeti erutebeghị ruo elekere anọ n'ehihie a, mana ha na agba mbọ ịgbapụta ndị tọrọ n'ime ụlọ a dara ada.

Ka ọ dị ugbua amabeghi mmadụ ole tọrọ n'ime ya bụ ụlọelu a dịka ọtụtụ ndị mmadụ bi ebe ahụ si ekwu.
Akụrụngwa pụrụiche e ji agụpụta ndị mmadụ n'ụdị ọnọdụ a awụchibeghị n'ogige ebe ihe a mere.

Ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbata gbata ekwuola na mmadụ olemole merụrụ ahụ.
Ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ ugbua na-akọ ndị be ha, ndị agbata obi ha nakwa ndị ọrụ nchekwa ka abịa gbapụta ha.
Ụlọ a dara bụ otu n'ime ụlọ elụ atọ nọkọrọ ọnụ, a na-arụ na mpaghara Parkview Ikoyi.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara aka ebe na ụlọ a dara dị ịrị na anọ na ogogo dịka abụọ ndị nke ọzọ ka kwu ọtọ na akụkụ ya nọkwa na ogogo iri na anọ.
Otu nwoke na ndị be ebe ahụ kwuru na kemgbe elekere mbụ nke ehihie ihe a mere na ha nọ na-akpọ ndị ọrụ gbata gbata mana ha abịabeghị ruo ugbua (elekere anọ nke ehihe).

Mkpu akwa na-afịọ n'ogige ihe a mere.
Otu nwoke nọ ebe a na-ebe akwa na nwanne ya nọ n'ime ụlọ ahụ dịka ọ hapụrụ nwanne ya gaa izụta nrị ma ekwe ntị nwanne ya anaghi agazi ugbua.
Ndị nọ ebe ahụ ugbua na-ewe ịwe na ndị ọrụ nchekwa na ndị ọrụ gbata gbata abịabeghi ugbua.
Amabeghị ihe mmadụ ole nọ n'ime ụlọ a, mbọ a na-agba ka ekwuturu ndị nwee ụlọ a enwebeghi isi ugbua.

Amabeghi ihe mere ụlọ ji daa dịka ọ ka bụ ụlọ arụchabeghi.
Ndị nọ ebe ahụ, nakwa otu n'ime ndị na-arụ ụlọ ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ na ụlọ a dara ka ndị nke ọzọ nọ ebe ahụ elụ dịka ọ dị iri abụọ na otu.
Nke a ga eme ya mmadụ abụọ ekwurula nwụrụ ebe ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na kpachi kpachi ụzọ bụ ihe gbochiri ndị ọrụ nchekwa na ọrụ gbata gbata ibịa ebe ahụ ugbua.
Dịka ndị nọ ebe ahụ na ewe ịwe na akụrụngwe ndị ọrụ gbata gbata abịabeghi n'igwe na ha ga ejị aka ha malịte igba mbọ igbapụta ndị a ugbua, nke a na eme na ebe elekere anọ na ọkara.
Akụkọ kwukwara na ndị na-arụ ụlọ nọ na-eme ọgbakọ mgbe ihe ọdachị a mere.







