Canada ga-enye ndị Naịjirịa enweghị akwụkwọ ọsọ

Ebe foto si, Getty Images
Mba Kanada sị na ọ ga-abụzị 'kwapụ kwapụ' ka ha ga-eji chụlaa ndị Naịjirịa na-ejịghị akwụkwọ ikike bata mba ahụ.
Ọtụtụ ndị Naịjirịa si Amerịka bata Kanada mgbe Donald Trump batara obodo ahụ dịka onyeisiala.
N'agbanyeghị na ọ bụghi naanị ndị Naịjirịa ka nchụla a metụtara, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ ga-aka metụta makana ndị Naịjirịa karịchara na ndị na-ejighị akwụkwọ nọrọ na Kanada.
Onwereike bụrụ ntuliaka ndị Kanada na-achọ ime n'afọ 2019 kwanyere pati nọ n'ọchịchị n'ụdịrị omume a.
Ọkaiwu isii gwara ụlo ntaakụkọ Reuters na ọ bu eziokwu na anya gọọmentị Kanada na-acha ọbara ọbara banyere etu ndị mmadụ si abata mba ha na-ejịghị akwụkwọ.
Ha kwukwara na ọ bu ndị Naịjirịa na ndị mba Haiti ka ndị Kanada na-arọ anya.

Ebe foto si, Getty Images
Ụjọ na Trump ga-emezu nkwa o kwere ndị nkwado ya na ọ ga-etinye anya na ndị na-ejighi akwụkwọ nọrọ na Amerịka, so mee ka ndị mmadụ na-agbaga Kanada.
Ihe karịrị mmadụ 36,000 nke ndi Naịjirịa so n'ime ya, si Amerịka gbaga Kanada maka ụjọ a.
Trump n'onwe ya na-agba mbọ imezu nkwa o kwere.
N'ime ụbọchị ole na ole gara aga, Trump kwuru na ọ ga-emegharị iwu nke kwuru na onye ọbụla amụrụ n'Amerịka bụ onye Amerịka.
Ka Amerịka dịzị ọkụ, Kanada bụ agbatobi ha bụ ebe ndị mmadụ na-etinyezi anya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









