Canada shooting: Egbuola nwoke gbagburu mmadụ 16 na Kanada

Ebe foto si, earthshod_kuunda
Ndị uweojii ekwuola na otu nwoke aha ya bụ Gabriel Worthman gbara afo iri ise na otu ji egbe gbagbuo mmadu iri na isii nke gụnyere otu onye uweojii n'obodo Nova scotia nke dị na mba kanada n'ụbọchị satụde alaala mụọ dịka ndị uweojii na achọ ijide ya.
Otu onyeisi ndị uweojii bụ Chris Leather gwara ndị ntaakụkọ na ha chọtara nwoke a n'ụbọchi sunde n'ebe gwongworo ya a nọ.
Leather kwuru na ha amatabeghị ebum n'ụche nwoke a ma kọwaa na Worthman yi ụfọdụ uwe ndi uweojii ma nyara kwa ugbọala nke dka nke ndị ụweojii nke mere ka ijide ya sie ike.
Ọ kọwara na mkpamkpa bụ nkata agbara nke ọma ebe nwoke a ji ụgbọala ndị uwe ojii na uwe ha were gbuo ọchụ a.
Leather kwukwara na ha gwara ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ ma meche ụzọ ha mgbe ha na-achọ Worthman.

Onyeisi otu ndị uweojii bụ Brian Suave kwuputara obi iri-uju ha ọkachasị onyeuweojii bụ Constble Heidi Stevenson onye nwụrụ n'aka nwoke a ma too ndị uweojii niile tinyere aka n'ijide nwoke a ọkachasị ndị merụrụ ahụ.
Onye ọchịchị obodo Nova Scotia kwuru na obodo a ahutubeghị ụdịrị mkpamkpa mbụ ma sị " amaghị m na ọ bụ ụdịrị akụko a ka m ga-eji teta ụra n'ụbọchi taa, na otu onye omekome na-agba egbe aghara aghara".
N'otu aka ahụ ka onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau kwuru na akara twitter ya " Obi anyị nọnyere ndi niile mkpamkpa a metụtara, anyị so unu eri uju".









