Ekwensu, Amadioha na Kamalu, Njoku, na arụsị ndị Igbo na-achụnyere aja

Ebe foto si, BBC/Getty Images
Ndị Igbo nwere otu Chi nke bụ Chineke (Chi na eke) maọbụ Chukwu Okike.
Ka o kechara ụwa o dinye Anyanwụ (Anya na-adịghị anwụ anwụ/Anya Chineke) ka o si n'aka nri na aka ekpe na-ahụ ihe na-eme n'ụwa, dinye Ọnwa ka o si n'ihu (ugwu) na-ahụ ihe na-eme n'ụwa ruo n'azụ (ndagwurugwu).
Njem Anyanwụ na njem ọnwa kere ụwa ụzọ anọ; Eke, Orie, Afọ, Nkwọ.
Dịka ndị Igbo kwenyere n'ike Chineke, ha kwenyekwara n'arụsị dị iche iche nke ha na-achụnyere aja n'oge dị iche iche.
Ndị Igbo kwenyere na ọ bụ Chineke kere arụsị ndị na-enyere ya aka, ma nyefee ha n'aka mba dị iche iche ka ha na-achụnyere ya aja ma na-esikwa n'aka ha arịọ ihe ndị dị ha mkpa.
Arụsị ndị Igbo na-achụnyere aja
Ụfọdụ bụ arụsị ndị na-alụ ma na-egbo ọgụ, nke na-ahụ maka ọmụmụ, nke na-ahụ maka ihe a kọrọ n'ubi, mmiri wdgz.
Ọkammụta Chiagozie Nnabuihe nke Mahadum Legọs (Unilag) kọwaara BBC Igbo maka arụsị ndị a na ọrụ ha na-arụ n'ala Igbo.
Ala
Ala bụ arụsị ọkwa ya rịrị arị n'ogogo chi ndị Igbo kwenyere na ya; Igbo na-akacha enye ala nsọpụrụ.
Maka gịnị ka ala ji dịrị mkpa? N'ala ka a mụrụ mmadụ, ebe ahụ ka ọ ga-alaghachịkwa ma ọ nwụọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ala nkịtị (na-abụghị nke e tere ihe) anaghị egbu mmadụ; o nwere ike ịmerụ mmadụ ahụ mana ọbara onye ahụ metụ n'aja ya na ya bụ otu.
Dịka Nnabuihe si kwuo, ọ bụ ala putere ihe dị n'ọhịa, ihe o putere bụ nri ma bụrụkwa ọgwụ (enweghi ọrịa dị n'ala Igbo nke na-enweghi akwụkwọ, osisi maọbụ mgbọrọọgwụ na-agwọ ya); nke bụ na ala na-elekọta mmadụ.

Igbo na-atụ ihe ọbụla ha chere ga-eme ka iwe wee ala egwu (ya ka e ji na-ekwu maka omenala; ihe na-eme n'ala), ya ka e ji ekwukwa maka nsọala (ihe ala na-asọ nsọ).
Ya mere onye mee ihe ọjọọ a sị ka a kpụọ ala, iji sachaa ihe ọjọọ ndị ahụ o mere. A na-eme nke a iji gbochie ala iwe iwe, n'ihi na a na-eche na ala wee iwe ihe a kụrụ n'ala nwere ike ghara ipu, ka mmiri ozizo ghara ịtakwasị ya, ya na anwụ ịchakwasị ya.
Mmiri
Mmiri niile dị n'ala Igbo bụ alụsị (river deities).

Alụsị ndị a nwere aha ndị gụnyere Owummiri, Idemmiri, Unammiri, Ogbuide na Ụrashị (Oguta Lake), wdgz.
Ị lee mmiri, ebe ọbụla mmiri ahụ nọ, ị ga-ahụ ebe ndị kwenyere n'ikike ya (ndị ụka ọdịnala) na-achụ aja iji kpọkuo mmụọ mmiri ahụ.
Onye na-achụ aja kwenyere na mmiri na-enwe nsọ, ụfọdụ anaghị asa akwa maọbụ egwu mmiri na ya.
Ụfọdụ mmiri ndị mmadụ na-efe n'ala Igbo gụnyere mmiri Njaba, Ụrashị, Imo,Ọtammiri, Nkịsị wdgz.
Igwe
A na-ahụta igwe na ọ bụ ebe Chukwu nọ; na ọ bụ ebe anyanwụ na ọnwa na-esi aga ije ha.
Mana ala ka Igwe n'ọkwa n'ihe gbasara arụsị ndị e nwere n'ụwa.
Eke kere ụwa, Chi ukwu
Ọ dị elu karịa chi ndị ọzọ.
Ekwensu
Ajọ mmụọ bụ ekwensu na-agba mmadụ mgba, na nkwenye ndị ụka.
Ekwensu abụghị 'Satan, ọ bụ ị kwe ya esu (ị chọọ ya okwu), ọ bụghị mmụọ na-eweta ọganihu.
Mmụọ na-arụ ụdị ọrụ 'Satan' na-arụ.
Na nkwenye ndị Igbo tupu ụka abịa, ọ bụ arụsị na-arụ ajọ ọrụ, na-anaghị eme ezigbo ihe.
Ikenga
Ike gbasara nwoke. Ọ bụ arụsị nwere ikike ebe ụmụnwoke nọ.
E ji mpi abụọ, maọbụ ihe na-edu mmadụ.
Ikenga mmadụ bụ ihe na-edu ya. E nwere ihe a tụrụ atụ na-egosi ikenga.
Amadiọha
Ọ bụ arụsị na-ahụ maka egbeigwe (deity of thunder).
Ọ bụ onye ozi. Ọ bụ onye ozi iwe Chukwu. Ebe igwe dị agha mere, egbeigwe nwere ike ịgba mebie ya.
Amadiọha na-aga, ọ na-egosi onwe ya dịka ebule.
Kamalụ
Kamalụ na-eji egbeigwe arụ ọrụ.
Ebe Amadiọha bụ egbeigwe, Kamalụ bụ amụma mmiri na-edupute ya. Ha abụọ bụ nke Bekee kpọrọ 'thunder and lightening bolt'.
Ọ bụ ebe Etche dị na Rivas steeti n'ebe a na-akpọ Ọzụzụ (Kamalụ-Ọzụzụ) ka isi Kamalụ nọ, dịka ụfọdụ ndị Igbo kwenyere.
Agwụ
Agwụ bụ mmụọ. ọ dị ụdịrị abụọ; ezi agwụ na agwụ ọjọọ. Agwụ nwere ihu abụọ.
Agwụ na-eweta ọdachị bụ agwụ ọjọọ (malevolent spirit).
Aha dịka Agwụdịire, Agwụncha wee dịrị gawazie, bụ ndị a na-azakarị iji rubere ya isi.
Agwụnsi
Agwụnsị bụ arụsị. Ọ bụ arụsị gbasara ịgwọ ọgwụ.
A sị na-akpa mmadụ, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-arụtụ aka n'ajọ agwa. Ọ pụtara na ọ naghị e mere mmadụ ihe ọma.
Onye ahụ o nwee ihe a sị ya mee, ya achọghị, ihe ọjọọ nwere ike bido na-eme ya.
Njọkụ
Njọkụ bụ chi nwe ji. A na-akpọkarị ya Njọkụ ji maọbụ Ahajiọkụ, mkpọbiri ya bụ Njoku.
Ọ bụ arụsị na-ahụ maka ọrụ ugbo.
Ọ bụ otu n'ime nwa Igbo; Igbo nwere ụmụ, ọkpara ya bụ Njọkụ.
E nwere mgbe ụmụ Igbo bịara na-anwụsị, Chukwu asị ya gbuo nwa ya bụ Njọkụ were chụọ aja. O were ya berisia ya, kụọ ya n'ala, ome ji epuo.
Ọdịnala
Ọdịnala bụ ihe dị na be ndị, ihe na-eme n'obodo ọbụla.
Omenala bụ etu ndị si ebi ndụ. Ọ sara mbara n'ihi na o metụtara ihe niile; mmepe ndị, etu ha si akwa ozu, nkwenye ha, wdgz.
Ha abụọ na-arụtụ aka etu ndị si ebi, asụsụ ha, etu ha si ebi, ihe ha nwere ike iwepụta (craft), iwu na-achị ndị.
Arụsị ndị ọzọ gụnyere Ogbunabalị, Akara aka, Ọfọ na ogu (nke na-ahụ maka eziokwu na ikpe ziri ezi) wdgz.

















