Etu mmiri Ivo Dam siri rie mmadụ atọ n'Ebonyi steeti

Ide mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ndị bi n'obodo dị n'okpuru ọchịchị Ivo nke Ebonyi steeti na-ebe akwa arịrị dịka ọdọmmiri 'Ivo Dam' gọọmentị bidoro ịrụ ma hapụ, ebutere idemiri gburu mmadụ abụọ n'ụbọchị Mọnde.

Otu onye nọ ebe o mere bụ Innocent Igwe nke obodo Amedu Ngwongwo Isiagu dị n'okpuruọchịchị Ivo gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ, ndị o nyere aha ha dịka Rolland Aja Orji na Ivoke Aja nwụrụ n'ụbọchị 28 (iri abụọ na asato) nke ọnwa Disemba afọ 2020, na-aga n'ugbo ha oge ọdachị ahụ dakwasara ha.

Nke a abụghị mbụ idemmiri si 'Ivo Dam' ahụ na-ata isi mmadụ.

Dịka Igwe siri kwuo, ndị nwụrụla site n'idemmiri kemgbe ọnwa Novemba afọ 2020 gụnyere; Oriakụ Udu Ajali nwụrụ n'ụbọchị iri na ise nke ọnwa Nọvemba; Mazị Cletus Okorie nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Disemba.

Ọ bụ n'afọ 2014 ka ndị ọrụ ngo gọọmenti bidoro ya bụ ọdọmmiri kama ha kwụsịrị ọrụ n'afo 2015.

Ivo Dam

O kwuru sị, " Ọ bụ ụlọorụ "Anbeez Services Nigeria Limited" nke di n'Enugwu ka enyere ọrụ ya bụ ọdọmmiri, kama ha kwụsịrị ọrụ nke mere ka idemmiri mebie ọtụtụ ihe n'obodo anyị".

Igwe kọwakwara sị, "anyị akpọkuola Gọọmentị Ebonyi steeti na Gọọmentị Etiti ma enweghị onye bịara ịzọpụta anyị".

Ivo Dam

Ọ kọwara na ihe dịka ala ruru hekta iri bụ ihe ya bụ ide mmiri rierela, chụpụ ụfọdụ n'ime ha n'ụlo ha ma mebie ihe ha kọrọ dịka ji, ede, egusi na ihe ndị ọzọ ka kọrọ n'ubi ha.

Igwe kwuru sị, " Ọ bụrụ na gọọmentị emeghị ihe ọbụla, anyị ga-eme ngaghariiwe".

Idemmiri Ivo Dam butere

Ndị idemmiri ahụ na-awakpo karịa gụnyere obodo Amokwe, Ngwongwo, Okwe na Ameke.

Aha onyonyo, Nwoke a na-ebe akwa maka nwunye abụọ ya nwụrụ n'ihe mberede Ebonyi

Gịnị ka ụlọọrụ Anbeez Services Nigeria Limited nwere ikwu?

Otu onye ụlọọrụ Anbeez Services Nigeria Limited gwara BBCIgbo na mmiri dị na mpaghara Ivo na-ebute ide mmiri na mbụ na ọbụghị oge ebidoro ịrụ ya bụ ọdọ mmiri ka ide mmiri ahụ bidoro.

O kwuru sị, "mbụ, ide mmiri a na-ebu akwa mmiri ndị dị ebe ahụ na mbụ".

Aha onyonyo, Nnennaya Okoriano: 'Ndị kụtụrụ ụlọ m na-arụgharị ya' - Nwaanyị ajadu Ebonyi steeti

O kwuru na ihe mere arụchabeghị ya bụ ọdọ mmiri bụ maka na a chọrọ ịrụ akwa mmiri ga-agafe ya bụ ọdọ mmiri ma sịkwa na ha chọrọ ịgbanwe ogoogo ya bụ ọdọ mmiri.

O kwughị oge ha ga-ebido ọrụ na ya bụ ọdọ mmiri.

Ihe gọọmentị Ebonyi steeti nwere ikwu

Kọmịshọna mgbasa ozi nke Ebonyi bụ Uchenna Orji gwara BBC Igbo sịrị n'ezie na ha ma maka ọnọdụ ọdọmmiri Ivo.

Orji sị, "Eeee, a ma m maka ihe mere nụ n'ihi na mụ onwe m bụ onye obodo Ngwongwo".

Ọ kọwara na ọ bụ site na mbọ onyeomeiwu Ike Ekweremadu ka e ji webata ya bụ ọdọmmiri.

Orji kwuru na-arụchaghị ya bụ ọdọ mmiri ọfụma nke mere na mmiri na-adọ n'ụbi bụ ihe ndị obodo ndi a ji mere aka ọrụ.

Aha onyonyo, Rice economy: Ihe niile dị n'osikapa bara uru

O kwuru na ya bụ okwu ọdo mmiri a akpọgala ya Abuja ma sị na ha na-arịọ gọọmentị etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ma na arịọkwa ndị obodo ka ha hapụ ị ga-ebe mmiri a nọ.

Ọ kọwara sị, "Anyị kpọtara Mịnịsta na-ahjụ maka mmiri bụ Suleiman Hussein Adamu, ọ bịara gaharịa were sị na arụtaghị ya bụ ọdo mmiri nke ọma".

Adamu gwara ha na ọ bụghi ya bidoro ya bụ ọrụ kama na ọ ga-agbalị hụ na etinyere ya na Bọjet.

Orji kọwara na ọ bụ tupu emee ntuliaka afọ 2019 ka Adamu bịara nje m a.

O kwuru sị, " gọọmentị gbata bia rụchaa ya bụ ọdọmmirị. Dịka ọ dị ugbua, anyị ejighị ya akọ nri ma ọ na-ebute idemmiri na-emebi ubi anyị."

Orji kọwara na ọdọ mmiri bụ ihe ndị ugwu ji akọ nrị , ya mere ha jiri chọọ ya kama arụtaghị nke ọma.