Coronavirus n'Afrịka: O meela ọnwa isii coronavirus batara Afrịka

Olusegun Obasanjo

Ebe foto si, Olusegun Obasanjo

Nkọwa foto, Onye chịburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo mere nnyocha maka coronavirus

Otu jikọrọ mba niile dị n'Afrịka bụ 'African Union' akpọọla oku ka onye ọbụla kee ajị n'ume dịka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa coronavirus agafeela otu nde.

Dịka ndị AU si kwuo, ọkara ndị niile bu ya bụ ọrịa n'Afrịka bụ na Saụt Afrịka.

Ha kwukwara na ihe na-eme na Tanzania na-awa ha isi n'ihi na mba ahụ enweghị ezi ọnụọgụgụ maka ndị bu ya bụ ọrịa.

Onyeisi ngalaba mgbochi ọrịa na-efe efe na AU bụ John Nkengasong kwuru sị: "Anyị arịọla Tanzania ka ha nye anyị ezigbo ọnụọgụgụ maka ndị bu Covid-19 mana ha enyebeghị anyị ọsịsa ziri ezi."

Mba kacha nwee ndị bu coronavirus n'Afrịka
Nkọwa foto, Mba kacha nwee ndị bu coronavirus n'Afrịka

Ndị ọkacha mara ekwuola na onweghi onye ma nke bụ eziokwu mmadụ ole bu coronavirus n'Afrịka n'ihi na ọnụọgụgụ ya ezuchaghị oke.

Ihe karịrị puku mmadụ iri abụọ na abụọ anwụọla n'Afrịka niile n'ihi ọrịa coronavirus, ebe mmadụ 690,000 agbakeela.

Mba kacha nwee ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus n'Afrịka
Nkọwa foto, Mba kacha nwee ndị gbakerela n'ọrịa coronavirus n'Afrịka

John Nkengasong kwuru na nnyocha Covid-19 e merela n'Afrịka agafeela nde asatọ, mana ọ bụrụ na ihe gara etu e si chee, o kwesila ịgafe nde 13.

Ijipt bụ mba izizi coronavirus batara n'Afrịka n'ọnwa Febrụwarị 2020, dịka ọ gachara izuụka atọ ya bụ ọrịa banyere na Yurop.

Ka ọ dị ugbua, Saụt Afrịka na Ijipt bụ mba abụọ ọrịa a kacha akpa ike n'Afrịka niile.

Mba coronavirus kacha gbuo mmadụ n'Afrịka
Nkọwa foto, Mba coronavirus kacha gbuo mmadụ n'Afrịka

Mana John Nkengasong gwara BBC na ụlọọrụ ya jikwa ọdụ anya ele mba ụfọdụ ebe ya bụ ọrịa ji nwayọ agbalite dịka Naịjirịa, Gana, Kenya, Etiopia, Sudan, Zambịa na Zimbabwe.

Ndị ọkachamara etoola Afrịka maka mbọ ha gbara igbochi mfesa coronavirus, ọkachasị etu ha si kpọchie mba ha n'oge.

Nke a kpatara na ndị bu coronavirus n'Afrịka dị nta karịa ndị nke Yurop (otu nde na ụma) nakwa ndị nke Amerịka (nde anọ na ụma).

Ndị buterela coronavirus n'ụwa niile

Mana ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ n'Afrịka anaghị eme nnyocha maka ọrịa a etu o kwesịrị.

Nnyocha egosila na ọgwụ mgbochi nke e mepụtara na Mahadum Oxford dịka ọ na-arụ ọrụ. A gbara ụfọdụ ndị mmadụ ya bụ ọgwụ na Saụt Afrịka.

Mana John Nkengasong na-ekwu na ihe ga-aka enye aka bụ ndị mmadụ iyi akwa mkpuchi imi Bekee kpọrọ 'facemask'.

Aha onyonyo, Mara ma mask ọ ga-egbochi gị ibute ọrịa Coronavirus
Akara ntụ-ntụ
coronavirus
coronavirus branding
Akara ntụ-ntụ
Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Coronavirus Tips: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus?