Coronavirus: 'Lockdown' agbanweeela etu ụwa sị atụgharị okirikiri anyanwụ

Ụwa

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, Ndị ọkacha mara kwuru na ụwa na-ama jijiji n'ihi ọtụtụ ihe ndị mmadụ na'eme

Ijeri kwuru ijeri mmadụ n'ụwa dum nọ n'ụlọ maka mmachi ngagharị (lockdown) n'ihi ọrịa coronavirus - nke a ebidola ịgbanwe etu ụwa si atụgharị okirikiri anyanwụ.

N'ihi mmachi a, njem maka ọrụ maọbụ egwuregwu, n'okporoụzọ maọbụ n'okporo ụgbọoloko belatara, ebe ụlọ mmepụta ngwahịa dị arọ mechiri emechi.

N'ezie, ọtụtụ n'ime anyị welatara aka n'ihe anyị na-emebu.

coronavirus

Nke a mere ka nnugha ụwa na-enugha belata.

Ọ bụ ihe ịtụnanya ịmata n'ụwa anyị a dị arụ karịa tọn tarị ijeri isii (six billion trillion tonnes).

Mgbanwe pụrụ iche

Empty streets in Paris

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, City streets around the world are empty as people stay indoors due to coronavirus lockdowns

Ndị ọkammụta sayensịa na 'Royal Observatory' nke mba Belgium bụ ndị nyopụtara mgbanwe a.

Ndị nnyocha chọpụtakwara mgbanwe a n'ebe dị icheiche na gburugburu ụwa.

Na Nepal, a hụrụ ya. Otu onye na-arụ ọrụ na 'Paris Institute of Earth Physics' kwuru na mgbadata ntụgharị ụwa ha hụrụ n'isi obodo ahụ kara aka.

Otu okwu ahụ ka ndị mere nchọpụta na Cal Tech University dị na mba Amerịka kwuru na ihe ha nyopụtara na Los Angeles gbara ha nnukwu gharịị

Ikuku dịzị ọcha karịa, ebe okeosimiri deere jụụ.

Nchọpụta gosiri ajọ ikuku

Ụlọụka kpọchiri akpọchi
Nkọwa foto, Na Naịjirịa, ọtụtụ ụlọụka kpọchiri akpọchi n'oge a

'Nitrogen dioxide' si n'ụgbọala na injini na-enye ọkụ ebelatala.

Ndị sayentịsti kwukwara na oke mkpọtụ na-eme n'obodo mepere emepe belatara.

N'otu aka ahụkwa, ndị na-enyocha okeosimiri kwukwara na mkpatụ osimiri belatara

Mgbanwe a na-abịa, lakwaa

Iro niile tọgbọ chakoo
Nkọwa foto, Iro niile tọgbọ chakoo

Mgbanwe nile abụghị ihe ọhụrụ.

Ndị mmadụ na-akpagharị n'ehihie karịa n'abalị nke mere abalị ji ajụ oyi karịa ehihie.

Mbelata ntụgharị ụwa na-emekwa n'oge ezumike na mmemme.

Mbelata ntụgharị nke mere n'izuụka na ọnwa olemole gara aga yiri nke a na-ahụ oge Ekeresimesi na mba ndị na-ekpe okpukpere Kraistị.