Electricity tariff: NERC ebulibeghị ụgwọ ọkụ latrik ọbụla

Ebe foto si, AFP
Ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa ọkụ na Naịjirịa bụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (Nerc), ekwuola na enwebeghi mgbanwe n'ụgwọ ọkụ ndị Naịjirịa ga na-akwụ.
Ha kwuru na ihe ha biputara na-egosi ụgwọ a ga na-akwụ n'afọ 2020 a, bụ nke na-egosi ihe iwu nagidere ha ị na-eme dịka ndị na-ekesa ọkụ latrik.
James Momoh bụ onyeisioche ngalaba Nerc kwuru na ha na-eme mbiputa a ugboro abụọ n'afọ, na ha emeela nke mbụ n'ọnwa Juun, ga-emekwa ya na Jenụwarị a, n'ihi na ọ bụ ọrụ ha.
O kwuru na n'ime ihe dị ka ọnwa atọ na-abịa, na ha ga ekwuputa ihe ha ga-achọpụta na ngagharị ha ga-eme; na ọ bụrụ na ha mechaa nzukọ ndị a kwuo na 'a gaghị etinyekwu ego", ọ pụtara na agaghị enwe mbulie ụgwọ ọbụla.
"Mana ọ bụrụ na a ga-etinyekwu ego, ọ ga-abụ maka ihe anyi kwutere na nzukọ".
"Anyị ga-agbasa ozi ga-akọwa ihe anyị kpebiri na nzukọ a, n'ụzọ onye ọbụla ga-aghọta, iwepụ mgbagwoju anya si na nke anyị biputaburu mbụ.
"Anyị na ngalaba na-ahụ maka nrụpụta ihe bụ Manufacturers Association of Nigeria nakwa ndị na-amụ ọkụ latrik ga-ekpebi tupu anyị ekpebie."
Kedụ ebe ndị bi n'Enugwu steeti kwụ gbasara ịkwụ N40,000 maka mita ọkụ latrik?

Ndị bi n'Enugwu steeti arịọla ka gọọmentị gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-agwa ha ka ha kwụọ puku iri anọ maka inweta mita ọhụrụ.
Ha kwuru na ha amaghi ebe ha kwụ akwụ n'okwu a, dịka EEDC bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ịkesa ọkụ latrik, gwara ha cheretu, oge ha gara ịkwụ ụgwọ ọkụ ha.
Ha kwuru sị na ndị EEDC kwuru na ha ga-abịa wepụ mita nke ochie, tinye nke ọhụrụ tupu ndị mmadụ amalite ịkwụ ụgwọ a, nakwa ụgwọ ọbụla ha ji.

Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo ka na-agbalị inweta onyeisi ndị EEDC n'ekwentị.
Ọkụ agbagbuola nwa akwụkwo n'Ọnịcha
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ọ bụ eziokwu na nwatakịrị dị afọ iri na otu nwụrụ n'ọkụ gbara n'ụlọakwụkwọ obibi Patterson memorial Grammar school di n'Ọnisha.
Haruna kwuru na ha ka na-enyocha ịma ihe bidoro ọkụ ahụ gbara n'abalị ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị a, ka ụmụaka ka si ịgba ekeresimesi lọta akwụkwọ.
Mwakpo mahadum dị n'Indịa,

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụakwụkwọ ndị mba India na-eme ngagharịiwe iji kwugide mwakpo ndị bu osisi wakporo ụmụakwụkwọ ibe ha na mahadum Jawaharlal Nehru dị n'obodo Delhi, ụbọchị ụka.
Ha na-eme nke a ka ihe ruru ndị nkuzi nakwa ụmụakwụkwọ iri anọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ maka ihe e tiri ha.
Ịkpa oke agbụrụ n'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Mario Balotelli sị ihere megbuo ndị na-akwado Lazio dị ka ha kwara ya emu ịkpa oke agbụrụ ka ha na Brescia zutere.
Ihe mere ụkọchukwu ji sụgbuo nwunye ya ma onwe ya n'elu ọlta

Ebe foto si, Getty Images
Otu ụkọchukwu egbuola onwe ya ma sụgbuo nwunye n'elu ọlta ka ha na-aka ụka ụbọchị Sọnde.
Di na nwunye a bụ ndị hibere ụlọụka ahụ dị na Mombasa, Kenya.
Ndị ụlọụka ahụ kwuru na Elisha Misiko bụ ụkọchukwu ahụ, nọkatara n'ihu oche tupu o mechaa gaa n'ebe nwunye ya bụ Ann Mghoi nọ n'elu ọlta, were ọtụtụ mma o zoro n'okpuru akwa ya sụkasịa nwunye ya ahụ.
Ka o mechara nke a, o were mma ahụ sụọ onwe ya n'afọ ma bewa akpịrị ya mgbe ndị ụlọụka ji ọsọ gbata n'ọlta.
Ọ nwụrụ ebe ahụ ozugbo ozugbo mana nwunye ya nwụrụ n'ụlọọgwụ.
Di na nwunye a agbasaala kemgbe ma na-ese okwu onye ga-abụ onyeisi ụlọụka ahụ dịka ụlọ mgbasaozi Daily Nation newspaper si depụta.
Ndị hụrụ ebe ihe a mere kọwaara ndị ntaakụkọ ka o si mee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị isi okpuruọchịchị nọ n'Imo steeti ga-alaghachite ọrụ taa

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Twitter
Mmadụ 27 bụ ndị isi oche okpuruọchịchị dị icheiche n'Imo steeti ga-alaghachi ọrụ taa.
Ọ bụ ụlọikpe kachasị nyere ha ikike a site na mkpebi ya na ndị gọvanọ na onyeisiala enweghi ikike ịmanye aka n'ihe gbasara okpuruọchịchị.
Cheta na gọọmentị Imo kwụsitụrụ ha ọrụ n'ọnwa Juun n'afọ 2019.
Na Kaduna,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọnụ ọgụ ndị nwụrụ na gaasị gbara na Kaduna eruola isii dịka ndị uweojii nọ na steeti ahụ si depụta.
Ha kwukwara na ngwongwo karịrị nde naira iri na isii bụ ihe furu n'ọkụ ahụ.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu egwuregwu Arsenal na Leeds ga-akwata ya na mgbede taa dịka egwuregwu FA Cup na-ebiri ọkụ.
Bịa lee akụko iribama maka nwoke kpuru isi na-arụ egine dị iche iche na webụsaiti anyị bụ bbc igbo.com.
Okwu Quasem Soleimani ka na-aga

Ebe foto si, Reuters
Dịka ọgbaghara na-ada n'ihi ọnwụ ọchịagha Quasem Soleimani n'aka ndị agha Amerịka, Onyeisiala Donald Trump eforola ntutu taa na aka ike ya ga-adakwasị mba Iraq maọbụrụ na ha chụpụ ndị agha Amerịka nọ n'ala ha.
Okwu Trump na-abịa dịka ndị omeiwu Iraq na-agwa ndị agha Amerịka si mba ha kwara lawa.
Igwe mmadụ gbakọrọ n'ụzọ Tehran bụ isi obodo Iran maka akwamozu onyeisi agha ha bụ Qassem Soleimani.
Soleimanị nwụrụ ka ogbunigwe nke Onyeisala US bụ Donald Trump si ka atụọ dara n'Iraq.
N'otu aka ahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Mohamed Adamu agwaala ndị otu ya dịrị njikere maka ọgbaghara ọbụla nwereike ịdapụta maka ọnwụ ọchịagha Iran bụ Quassem Soleimani.
Okwu ya bịara dịka ọ nụrụ kepu kepu na ọtụtụ otu dị icheiche na-akwado ịme ngagharịiwe maka ogbugbu mba Amerịka gburu Soleimani.
Tunde Bakare adụọla Buhari ndụmọdụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụkọchukwu bụ Tunde Bakare agwaala onyeisiala Muhammadu Buhari ya tinye anya n'onye ga-anọchi anya ya.
O kwuru na ọ bụrụ na Buhari bu ọdịnma Naịjirịa n'obi na o kwesiri ị hazi onye ga-anọchi anya ya n'ọkwa.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, @EnyimbaFC
Enyimba nke Aba na-achọ ikuru ume ndụ dịka Plateau United fọjuru ha goolu afọ mgbe ha zutere n'asọmpị Oriental Derby
Ọ bụ goolu anọ ka e ji merie Enyimba.
Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:
Ihe onyonyo ga-amasị gị











