Samuel Chukwueze: Nwaafọ Igbo a nọzị n'ofe ugbua

Ebe foto si, Twitter/Roc Nation Sports
Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwuezu nọzị mma na-ekwe oyooyoo ugbua dịka o sonyeerela ụlọọrụ 'Roc Nation Sports.'
Roc Nations Sports bụ nnukwu ụlọọrụ na-elekọta ndị egwuregwu dị icheiche nke onye nwe ya bụ otiegwu a ma ama aha ya bụ Jay Z.
Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n' akara Twitter ha ụbọchị Tọzde, na-eto Chukwueze dịka otu n'ime ndị ntorobịa bụ ọkacha agba bọọlụ na mba Afrịka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ka ọ dị ugbua, Chukwueze esonyerela ndị dịka Romelu Lukaku na Eric Bailly nke otu egwu Manchester United dịka ndị ụlọọrụ ahụ na-elekọta anya.
APC apịachiela akwụkwọ n'ụlọikpe

Ebe foto si, Twitter/Bayo Omoboriowo
Akụkọ sị Abuja pụta taa kwuru na ndị otu APC akpọghị onye akaebe ọbụla n'ikpe dị n'etiti Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar gbasara onye meriri ntuliaka nke 2019.
Cheta na Atiku na ndị otu ya bụ PDP gbara Buhari na ndị APC akwụkwọ na-ebo ha ebubo nrụrụaka na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa March.
Obi adịghị Okorocha mma

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI
Aka chịburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha agbarụọla ihu maka mweghara gọọmentị Imo weghaara 'Eastern Palm University' nke bụ otu n'ime mahadum ọ rụrụ tupu ọ rituo n'ọchịchị.
Kọmiti nke gọvanọ Emeka Ihedioha hibere gbasara nkea kwuru na Imo steeti enweghị ego iji lekọta imirikiti mahadum nke Okorocha sị na o rụrụ oge ọ bụ gọvanọ.
Ọrịa Ebola ka na-agbasakwa

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, mba Rwanda emechiela oke dị n'etiti ha na mba Congo n'ihi egwu na ọrịa Ebola nwere ike ịbata n'obodo ha.
Nke a mere dịka a chọpụtara onye nke atọ nwere ọrịa Ebola na mpaghara Goma bụ Obodo ya na Rwanda nwere oke ala.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










