NAF denial: A maghị ihe ụgbọelu ndịagha bịara ime n'obodo anyị - Ndị Akwụke

Ụgbọelu ndịagha

Ebe foto si, NAF

N'izuụka gara akụkọ kwuru na ndịagha ụgbọelu ji helịkọpta ebunye ndị ọchị ngwa ọgụ n'Akwuke dị n'Enugwu Steeti.

Ndịagha ụgbọelu site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Faith Aigbeoghain sị na nke a bụ ezigbo asị.

N'ihi ọtụtụ okwu nke a buterela na soshal midia, mere BBC Igbo ji jụọ ụfọdụ ndị obodo Akwụke ị mata nke bụ eziokwu.

Otu onye obodo Akwuke aha ya bụ Gabriel Ogbodo kwuru na ọ bụ eziokwu na ụgbọelu helikọpta nọ na-efeda n'Akwuke.

Mana ọ maghị ma onwere ndị ha na-ebunye ngwa ọgụ n'ebe ahụ dịka ha na-efedata, na ọ bụ n'ịntanet ka ọ nụrụ ya.

Aha onyonyo, Akwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo

Ogbodo kwuru na ụgbọelu helikọpta na-efedata n'ebe ahụ n'oge mbụ na nke a abụghị mbụ ọ na-eme n'obodo ha.

Eze Akwuke Uwani bụ Igwe Cyprian Ekwomchi kwuru na ọ nụrụ maka nke a mana o nweghi ihe ọ ga-ekwu banyere ya, kama ka a jụọ Igwe Akwuke nke ọzọ.

Mana Eze Akwuke nke ọzọ bụ Igwe Benard Nsude Nwoye kwuru na mgbe ọ nụrụ akụkọ a, na o zipụrụ ozi, iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu.

Igwe Benard Nwoye

N'okwu ya "Onye m zipụrụ ebe ahụ sị na ụgbọelu nwere agwa ndịagha fegharịcha na o fepụkwa."

O kwuru na ndị nọ n'ebe ahụ gwara ndị uweojii na o nweghi ngwaagha ọbụla ha hụrụ a na-ebubata. Mana na ndị uweojii ka na-eme nyocha banyere ya.

Igwe Nwoye sị na ọ kpọrọ onyeisi ndị Fulani n'Akwuke ka ọ maara ma o nwere kepukepu ọ nụrụ mana a sị na ọ na-arịa ọrịa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị obodo Akwuke na ndị Fulani nọ gburugburu ha bi n'udo kamgbe ọtụtụ afọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: