Okorocha: Anyị chọrọ ikpezi okwu pụtara na APC primaries

Ebe foto si, BBC Igbo
Gọvanọ Rochas Okorocha nke Imo steeti ekwupụtala ihe na ihe ha na onyeisiala Naijiria kpara na nzuko bụ banyere nsogbu dị na ntuliaka imeụlọ nke steeti ha ga.
Okorocha kwuru na ọ bụ ụzọ a ga-eji mee udo n'ime APC na steeti ndị ahụ dị iche iche bụ ihe ha na-achọ.
Buhari na ndị gọvanọ itoolu nke APC nwere nzukọ ụnyaahụ bụ Tọọsde n'Abuja.

Ebe foto si, Getty Images
Na nkọwa o nyere ndị ntaakụkọ e mechara ọgbakọ ahụ, Okorocha kwuru na ndị gọvanọ chọrọ ka e mee ihe ziri ezi site n'usoro iwu pati ahụ bụ nhatanha, ikpe ziri ezi na imezi ihe.
Mkparịtaụka ahụ ha nwere ụnyaahụ n'obi ọchịchị onyeisiala dị n'Abuja were ihe dịka awa abụọ na ọkara.
Ndị gọvanọ bịara ya gụnyere Abiola Ajimobi nke Oyo, Abdul'aziz Yari nke Zamfara, Ibikunle Amosun nke Ogun.
Ndị ọzọ bụ Rotimi Akeredolu nke Ondo, Simon Lalong nke Plateau, Abubakar Sani Bello nke Niger nakwa Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi steeti.






