Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Trump na Kim ezutela na Singapore
Akụkọ kachasị mere taa;
Humphrey Nwosu agaghị azanwu Buhari
Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka nke afọ 1993 nke họpụtara MKO Abiola dịka onyeisiala, ekwuola na ọ gaghị azanwu oku gọọmentị kpọrọ ya maka ikwanyere Abiola na ndị ọzọ ugwu.
Nwosu kelere gọọmentị maka nkwanye ugwu a, ma kwuo na ya agaghị abịanwu emume nke e hibere taa, maka na ọ nọ na mba ofesi.
Peter Obi etoola Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Peter Obi bụ onye chịburu Anambra steeti etoola Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ime ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.
Obi kwuru na ọ bụ ohere iji mezie ihe ndị mebirila na Naịjirịa nakwa imezi ihe na ndụ ndị ọzọ Juun 12 a metụtara dịka Humphrey Nwosu, Ralph Obioha nakwa Dan Suleiman.
Akụkọ mba ofesi;

Ebe foto si, Getty Images
Onye isiala mba Amerịka bụ Donald Trump na nke Nọt Koria bụ Kim Jong-Un ezutela ma kelee onwe ha na Singapore.
N'ime nzukọ a, ha binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta, ebe Kim kwuru na ha ekpebiela ịhapụ ihe ndị mere n'oge gara aga.
N'egwuruegwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị otu Super Falcons wụrụ ndị Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii asataghị otu ka ha na zutere na Lagọs maka ịmata onye ga-etozu isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị.
Desire Oparanozie nyere ọkpụ goolu anọ, ebe Asisat Oshoala nyere abụọ.











