'Baba Ijesha nwerike ịnọ na mkpọrọ ruo mgbe ọ nwụrụ'

Baba Ijesha inside role for one of im movies

Ebe foto si, BABA IJESHA/INSTAGRAM

Nkọwa foto, Baba Ijesha inside role for one of im movies
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

E nwerike ikpe Olanrewaju James e ji Baba Ijesha mara na Nollywood ikpe n'okpuru iwu ise nke Legọs steeti.

Nke a na-abịa dịka ndị uweojii nwụchichara Baba jesha maka ebubo mwakpo n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa Eprelu, 2021.

N'ime akwụkwọ ozi ọkaiwu ukwu Legọs steei bụ Moyosore Onigbanjo binyere aka, ndị uweojii mere mkpesa Ijesha na n'ụlọọrụ Directorate of Public Prosecutions. DPP maka ịnata ndụmọdụ iwu kwadoro.

Ozi ahụ kwuru na DPP gwara ndị uweojii ha wepụta ikpe a ga-ekpe ga-agbado ụkwụ n'iwu ise nke "2015 Criminal Law of Lagos state."

Section 135, bụ imetọ nwatankịrị nke ntaramahụhụ ya bụ ịga mkpọrọ ruo afọ asaa.

Section 137, Ịwakpo nwata n'ike nke ntaramahụhụ ya bụ ịga ụlọ mkpọrọ ruo mgbe o nye ahụ ga-anwụ.

Section 261, Iwakpo n'ike site na nrụnye nke ntaramahụhụ ya bụ ịga mkpọrọ ruo ọnwụ onye ahụ.

Section 262, Nwalee mwakpo site na nrụnye nke ntaramahụhụ ya bụ ịga mkpọrọ ruo afọ iri na anọ

Section 263, Mwakpo n'ike nke ntaramahụhụ ya bụ ịga nga ruo afọ atọ.

Gịnị ọzọ dị n'ime onyonyo na-egosi ebe Baba Ijesha na-emetụ nwagbọghọ aka?

Princess bụ ọkpaọchị ama ama

Ebe foto si, Princess Instagram

Nkọwa foto, Princess bụ ọkpaọchị ama ama

Ụmụ Naịjirịa na-eti mkpụ maka onyonyo na-efegaharị na soshal midia gosiri ebe Baba Ijesha na-eme ihe nkiri ama ama na-emetu nwagbọghọ aka n'ahụ na bee Princess bụ ọkpoachị.

N'ime onyonyo ahụ, Princess gwachara Baba Ijesha okwu, mepee ụzọ pụwa. Orughị otu nkeji, nwa bee ya bụ nwagbọghọ mechichara ụzọ, Baba Ijesha dọ ya aka metuwe ya aka n'ụkwụ ma na-esusu aka ya ọnụ.

Onyonyo ahụ gosiri na ụjọ ji nwagbọghọ ahụ aka dịka Baba Ijesha na-emetụ ya aka.

Cheta na Princess pụtaburu bo Baba Ijesha ebubo na ọ wakporo nwagbọghọ ahụ o kwuru dị afọ iri na anọ, mana ndị mmadụ kwuru ka o wepụta ihe gosiri na ọ na-ekwu eziokwu.

Princess kwukwara n'ihe nkiri o wepụtara etu o si kpọọ ndị uweojii ka ha nwuchie Baba Ijesha ụbọchị ahụ ọ biachara bee ma chọọ ịwakpo nwagbọghọ ahụ bi na bee ya.

Ihe ndị uweojii kwuru maka okwu a

Ndị uweojii nọ na Legọs gwara BBC na nso nso a na ha ka na-enyocha ya bụ ebubo.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs bụ Muyiwa Adejobi kwuru na onyonyo CCTV gosiri etu Baba Ijesha si na-emetọ nwagbọghọ ahụ na bee Princess.

O kwukara na a gwara ha na a na-ebo Baba Ijesha ebubo na ọ wakpobuola nwagbọgbọ ahụ mgbe ọ dị afọ asaa.

O kwuru na ọ bụrụ na ha mechaa nyocha ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe nakwa a ka na-eme ya nyocha.

Etu e si nwụchi Baba Ijesha

Ndị uweojii nọ na Legọs nwụchịrị Baba Ijesha na-eme iohe nkiri Nollywood n'April 22, 2021, kamgbe ahụ ka ha bidoro ime nyocha ha.

N'ụbọchị Tọsde bụ April 29, 2021, ha gwara BBC na ọ ka nọ n'aka ha.

Kamgbe a nwụchiri ya, ndị na-eme ihe nkiri ibe na-agbagha maka ebubo mwakpo e boro ya.

Iyabo Ojo, Biodun Okeowo, Tonto Dike nakwa Femi Branch bụ ụfọdụ n'ime ndị chọrọ ụlọikpe ma Baba Ijesha ikpe.

Mana Kehinde Adams, Yomi Fabiyi nakwa ndị ọzọ chọrọ ka ndị mmadụ nwe ndịdị ka ndị uweojii mechaa nyocha ha.

Ọtụtụ ụmụ Naịjiria amanyela ọnụ n'okwu a mana ndị uweojii akpụpụbeghị Baba Ijesha ụlọikpe makana Judicial Staff Union of Nigeria ka nọ n'igba abụbụ ọrụ.

Ọnụ na-ekwuru Theatre Arts and Motion Pictures Practitioners Association of Nigeria (Tampan) bụ Yemi Amodu katọrọ ebubo mwakpo ahụ mana ha rịọkwara ka onye ọbụla nwe ndịdị ka ụlọikpe ma Ijesha ikpe.

BBC chọpụtara na ruo ugbua, Baba Ijesha ka nọ n'aka ndị uweojii.

Akụko ndị ga-amasị gị: