Manchester United na Sevilla: E sewaala Manchester United agba ka 'Samson'

Ebe foto si, Europa League Twitter
Otu egwuregwu bọọlụ Sevilla nke mba Spen agụọrala ndị Manchester United egwu sị ha laruo na ndokwa ọ ga-adịrị gị mma.
Ọkpụ goolu abụọ a satara otu ka ha ji dulaa ndị Man Utd ụlọ n'asọmpi osote ikpeazụ nke egwuregwu Europa League.
Man Utd bu ụzọ were penaliti nye goolu nke mbụ.
Iji penaliti nye goolu buzi nnọọ aka ọrụ ndị Man Utd, mere ọtụtụ ji akpọ ha Penchester United.
Mana Sevilla sara goolu ahụ site n'aka Fernández Saez, ebe De Jong nyere goolu nke abụọ ha ji nwee mmeri.

Ebe foto si, Getty Images
Ka ọ dị ugbua, Sevilla etozuola iso gbaa asọmpi nke ikpeazụ nke Europa League.
Ha ga-ezute onye ọbụla meriri n'etiti Inter Milan na Shakhtar Donetsk n'abalị Mọnde.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










