Anambra State: Aka akparala onye eche n'aka ya dị na-ogbugbu Pa Iloanyusi
Ndị uweojii boro nwoke ebubo igbu ọchụ

Ebe foto si, MOhammed Haruna
N'Anambra steeti, aka ndị uweojii akpara Ikechukwu Emilie bụ onye ana-achọ achọ kemgbe afọ 2014 n'Abagana.
Ana ebo ya bụ nwaamdị ebubo ịtọọrọ ma gbuo Pa Iloanyusi bụ nna onye otu bọọlụ Super Eagles bụ Chikelu Iloanyusi.
Ntuliaka mmeju na Legọs

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ajọ mmadụ achụsala ndị ntaakụkọ na ntuliaka mmeju e mere na ọdọ ntuliaka iri asaa na otu na mpaghara Ajeromi-Ifelodun Federal Constituency nke Legọs.
Cheta na nwada Igbo bụ Rita Orji na-anọchite anya mpaghara ahụ bụ ọgbọ nta vootu sọ na ndị pụtara ya bụ ntuliaka.
Sri Lanka

Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ iri na ise ọzọ anwụọla ebe ndị uweojii bịara ibuso ndị omekome a sị na aka ha dị na ogbunigwe ahụ gburu mmadụ narị abụọ na iri ise na Sri Lanka ụbọchị ụka Easter gara aga.
West Ham na Tottenham

Ebe foto si, Reuters
N'egwuruegwu, West Ham eteela Tottenham ụnyị n'akwa ọhụrụ ha.
West Ham ji otu ọkpụ merie Tottenham na ọgbọegwuruegwu ha kemgbe amalitere ịsọmpị ebe ahụ.







