Okeala Naịjirịa agbapeela, leekwa ngwaahịa iwu ka machiri

Dịka ọtụtụ mmadụ na-amali elu maka okeala Naịjirịa na ndị agbataobi ha agbahere, ọ dị mkpa na anyị chetere onwe anyị ngwa ahịa bụ ahịa iwu.
Gọọmentị Naịjirịa mechiri okeala ha kemgbe ọnwa Ọgụst afọ 2019 maka ihe ha siri bụ mgba okpuru ndị agbataobi ha na-agba akụnaụba ha.
Onyeisi ndị ọrụ kọstọm na Naịjirịa bụ Hameed Ali sị na nke ahụ bụ maka inyere ndị ọrụ ya aka ijikwata okeala Naịjirịa.
Ihe ọzọ ha jikwa mechie okeala ndị ahụ bụ maka ịbelata oke ịtụbata nri na ihe ndị ọzọ ana eme na Naịjirịa, iji nyeaka ka ndị nke ana arụpụta na Naịjirịa too.
Ihe mmechi okeala butere
Mana mmechi okeala ndị a butere oke ụbịam na ọnụahịa iri elu karịa uru na ndụ ndị mmadụ.

Iji maa atụ, kemgbe otu afọ na ọnwa atọ na ụbọchị iri abụọ na asatọ emechiri ya bụ okeala, ọnọdụ ọtanisi gbasara nrị si na pasentị iri na atọ na ụma iri na asaa (13.17%) mgbe ebidoro ya, ruo pasentị iri na asatọ na ụma iri atọ (18.30%).
Ihe mmekpe okeala pụtara ugbua
Dịka atụrụ anya na ọnụ ahịa ụfọdọ nwereike ịgbadata, ọkachasị n'Ekeresimesi a, maka mmepe okeala ndị, ọ dịmkpa ka lee anya na ngwaahịa iwu megbidere maka adịghị ama ama.
Dịka Minista Ego, nhazi na Bọọjeti bụ Zainab Ahmed siri kwuo, Onyeisiala Muhammdu Buhari sị na mmachi etinyere n'osikapa, ọkụkọ na nri ndị ọzọ ka dịkwa etu ọ dị.
Nke a pụtara na ha ka bụ ahịa iwu.
Lekwa ngwahịa dị n'ọbaozi ndị kọstọm iwu machiri
- Nnunu (anụ ọkụkọ) maọbụ anụ ezi maọbụ anụ ehi.
- Akwa niile maọbụ nke abụrụabụ
- Manụ apapa maọbụ ụdị mmanụ ọbụla eji esi ihe dịka vegibelu ọyilụ na nke castọ.
- Sụga.
- Koko bụta na pawụda na keki
- Spageti na nudlu
- Mmiri mkpụrụ osisi
- Mmiri
- Simenti
- Ụfọdụ ọgwụ dịka parasịtamọlụ
- Ncha na ncha ntụ eji asụ akwa
- Ọgwụ eji achụ anwụnta
- Gbamgbam eji arụ ụlọ
- Nrị ekwentị
- Kapetị
- Akpụkpọ ụkwụ
- Kọmpressọ friji
- Akpụkpọ ụkwụ, akpa na ihe ndị ọzọ eji akpụkpọ rụọ
- Ọgbatumtum ochie gafere afọ iri na ise malite mgbe a rụrụ ya.
- Mkpịsị odee
- Tomatosu
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ịgbape bọda
Agbanyeghị ọṅụ ụfọdụ na-aṅụ, ụfọdụ na-akọtọkwa ya bụ okeala ndị emepere.
Mazị Reno Omokri na-ekwu na ya ahụghị uru ịkpape ya okeala bara ọkacha n'ụdị oge atọchaara ụmụakwụkwọ na Kankara abali ise gara aga.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Mr_Kunlecole nọ na ọnọdụ mgbagwoju anya dịka ọ na-ajụ onwe ya ihe ndị mmadụ chọrọ dịka ụfọdụ na akọtọ ya bụ mmepe bọda ebe ụfọdụ na-akọtọkwa ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2












