Nigerian Border Closure: 'Anyị ahụghị ngwaahịa zụta maka mmechi 'Border''
Ọtụtụ ụmụ Igbo na-azụ ma na-ere ahịa gbarụọla ihe na mmechi okeala Naịjirịa na mba ndị nke gọọmentị mechiri.
N'ime nyocha BBC Igbo mere iji mata etu mmechi okeala a si metụta ha, ha kwuru na onweghi ahia ha na-azụta.
Na nke a mere ha ji erezi ngwaahịa ha oke ọnụ, nke ndị na-azụ ha ahịa na-eme mkpesa banyere ya.
Mana otu onye sị na nke a emetutaghị ya maka na ọ na-eji ụgbọelu ebubata ngwaahịa ya si na mba Chaịna.
Kirie ihe ha kwuru n'uju.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: