World Food Day: Mama dị afọ 104 ji ọrụugbo zụọ ụmụ ya
Mama nnukwu Jessie Onuigwe bụ onye ọrụugbo si n'obodo Akabọ Osumenyi dị n'Anambra Steeti kọwara etu o ji were ọrụugbo zụọ ụmụ ya anọ.
Ọ sị na ọ bụ ọrụugbo a mere ahụ ji sie ya ezigbo ike dịka ọ nọ afọ otu narị na anọ ugbua.
Mama Jessie sị na ọ mụrụ ụmụ anọ na ụmụụmụ otu narị na iri abụọ na anọ.
O kwuru na ọ bụ ịkọ ugbo ka o ji malite ụwa bụ nke nyere ya ego o ji zụọ ụmụ ya.
Ada ya nwaanyị bụ Patience Uzoma Oguine dị afọ iri asaa na asatọ sị na di mama Jessie bụ nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere.
Na ọ bụ mama zụpụtara ha ruo mgbe ha tolitere lụọ dị.
Ọ sị na a mụrụ mama Jessie Onuigwe n'afọ 1915.
Mama Jessie gara n'ihu kwuo na ọ bụ iri nri Ndigbo na ikpere 'Jesus' mere o ji gbasie ike.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Akụkọ ga-amasị gị