Burnley vs Man City: Aguero edowela City n'ụzọ irite iko Premier League ọzọ
Akụkọ dị mkpa taa

Ebe foto si, AFP
Manchester City ka nọ n'ụzọ ịtụ ugo n'asọmpị Premier League nke 2019 ka goolu Sergio Aguero nyere ha mmeri na nzute ha na Burnley na ọgbo egwuregwu Turf Moor.
Igwe Bekee kpọrọ "goal-line technology" bu ihe eji kpebie na nrịba bọọlụ Aguero ziri ezi. Nke a goosiri etu ya bu asọmpi siri gaa - Man City abịaghị ka ndị zuru ka emee.
Burnley haziri onwe ha ọfụma nke, mana ọ bụ Man City ka mmeri bara n'aka ka onye na-egbu asọmpi ahụ gbuchiri ya.
Man City ga-anabata Burnley na be ha, ma gakwuru Brighton n'izu na-abịa.
Ha merie asọmpi abụọ, iko ga-abu nke ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa abaala ụzọ na Gombe
Ndị agha Naịjirịa ezipula ndị otu ha na Gombe ka ha kwado mmachi amachiri ngagharị na steeti ahụ kemgbe Satọde.
Onye nọchite odeakwụkwọ steeti ahụ bụ James Pisajih sị na nke a bụ ka egbochie ọgbaaghara nwere ike ịsochi ụmụaka ndị Boys Brigade nwụrụ n'izu gara aga.

Ebe foto si, Getty Images
IS "awakpola" ndị agha Naịjirịa
Otu ọmekataraihe pụụjọ bụ IS sị na ha egbuola ndị agha Naịjirịa mmadụ iri na kpụta otu onye ọzọ na ndụ na Borno steeti ụnyahụ.
Ndị omekome a kwuru na ha wakporo obi ndị agha Naịjirịa dị na Sabon Gari bụ nke dị na oteaka Maiduguri bụ isiobodo steeti ahụ bụ ebe ha butere ma mebie ọtụtụ ngwaagha.

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii awapoola ndị a na-ache na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe n' Sri Lanka
N'ofesi e, ndị uweojii obi dị inu awakpoola ọdọ ndị omekome bụ ndị ha sị na tụrụ ogbunigwe gburu ọtụtụ mmadụ na Sri Lanka tata bụ ụka.
Gọọmentị mba ahụ amachiela ya bụ otu akpọrọ Thawheedh Jamaath na be ha.












