Ihe anyị ma maka ihe a sị na-eme n’akụkụ Ihube ugbua

Akụkụ Ihube

Ebe foto si, Screen grab

Nkọwa foto, Foto a sị si akụkụ Ihube na Okigwe.

Akụkọ apụtala taa bụ ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2022 na ọkụ na-agba n’akụkụ Ihube nakwa Okigwe bụ ebe metụtara Abia na Imo steeti.

Akụkọ si mpaghara apụta na-ekwu na ndị amabeghị ndị ha bụ wakporo mpaghara Okigwe/Ihube/Umulolo na Aku bụ mpaghara metụtara Abia na Imo steeti ma na-agba ọtụtụ ụlọ nakwa ụlọahịa ndị mmadụ ọkụ.

Akụkụ Ihube

Ebe foto si, Screen Grab

Nkọwa foto, Foto a sị si akụkụ Ihube na Okigwe.

Otu onye hụrụ ihe na-ebe ahụ gwara BBC Igbo:

“A nọ m na-eme njem, dịka anyị ruru okpuruụzọ Enugu/Pọta kọọtụ, ndịagha Naịjirịa gwara anyị niile pụta n’ụgbọala anyị ma nye iwu ka anyị chiile aka anyị elu.”

“A hụrụ m ebe ha sị ụfọdụ tukwuru n’ala ebe ndị ọzọ sekpu ala gụnyere ụmụnwaanyị nakwa ndị ntorobịa.”

“Otu onye n’ime ndị agha kwuru na ha na-arụ ọrụ nchekwa n’ihi otu onye otu ha nwaanyị ndị otu ojiegbe ‘unknown men’ tọọrọ na mpaghara ahụ.”

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Imo steeti bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo na “Enweghị ihe ndị uweojii ma maka ihe a na-eme na mpaghara a.”

Ọ saghị ajụjụ ndị ọzọ banyere ihe a sị na-eme ebe ahụ.

Ọtụtụ ihe onyonyo nakwa foto amalitela ịpụta na soshal midia nke na-egosi ebe ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ na-agba ọkụ dịka igwe ndị mmadụ na-agba ọsọ aghara aghara.

N’otu n’ime ihe onyonyo ndị ahụ, olu nọ na-ada na ya bọrọ ebubo na-arụ aka na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị mere ya bụ mwakpo.

O kwuru:

“Ndị gọọmentị ka ị ji egwu egwu, ndị a nye iwu mmachi ngagharị ndị mmadụ nke ‘State of Emergency ebe a ugbua, ọsọ ga-agba”

Ndị na-ekesa ihe onyonyo ndị a na-arụ aka na na’ezie na ebe ya bụ ihe na-eme bụ n’akụkụ Okigwe/Ihube/Umulolo na Aku.

Cheta na mpaghara a nke onye ahụ gwara BBC Igbo okwu sị na ọ hụrụ ihe na-eme bụ mpaghara ndịagha Naịjirịa zipụtara ozi banyere ntọrọ onye otu ha nwaanyị n’ụbọchị Fraịdee.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ndị agha Naịjirịa amịtabeghị mkpụrụ ruo ugbua n'ihi ha azabeghị ozi anyị.

Onyeisi ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigerian Army HQ/Facebook

Ihe ndịagha Naịjirịa kwuru maka akụkọ ntọrọ a

Ndị agha Naịjirịa kwuru n’ụbọchị Fraịde na akụkọ na-ekwu na ha azọpụtala otu onye otu ha nwaanyị bụ PP Johnson bụ onye a tọọrọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba a abụghị eziokwu. 

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi Onyema Nwachukwu depụtara ka ha kwuru nke a.

Ha kwuru na ihe onyonyo na-efegharị bụ ihe onyonyo mgbe ha zọpụtara onye ọzọ na mbụ. 

A tọọrọ Johnson dịka ọ si ọzụzụ ndị agha pụta ebe e nyere ya ọkwa Lietenant ma gaa ileta nnenne ya n'Aku-Okigwe mgbe atọọrọya.

Nke a na-eso ihe onyonyo nke gosiri ebe ndị tọọrọ ya na-ekwu na ịtọrọ nwata nwaanyị a so n'usoro ha ji achọta nwereonwe Biafra.

Akwụkwọ ozi a kwuru sị, " Ihe a na-egosi mpụ ndị Ipob/ESN na-eme ndị Igbo, ndị ha sị ha na-azọrọ ha nwereonwe".