Ihe ise m ga-eme ma m zọta ọkwa onyeisiala Naịjiria - Atiku Abubakar

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Atiku Abubakar Facebook

Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP), ekwuola ihe ọ chọrọ imere Naịjiria ma ọ zọta ya bụ oche.

Na mkparịtaụka ya na BBC Hausa nwere nso nso a, Atiku kwuru na ọ ga-agbado anya n'ime ihe ise gbara ọkpụrụkpụ ma ọ bụrụ na ọ banye n'oche onyeisiala.

Ihe Ise Atiku kwuru ọ ga-emere Naịjiria

1) Iwelata ndịnotu n'etiti ndị Naịjiria

Atiku kwuru na nkewa na akpamoke dị n'etiti agbụrụ ndị dị na Naịjiria, na ọ bụghị naanị n'ihi ntuliaka na-abịa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe gbasara ọchịchị bụ otu n'ime ihe kachasị ebute nsogbu na mpaghara Ndịda, Ugwu, Ọdịda na Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria, ya mere o ji sị na ọ ga-agba mbọ ịhụ na o weghachitara ndịnotu na Naịjiria.

2) Iwelata udo

Otu ihe kacha echere Naịjiria aka mgba n'ime afọ ole na ole a bụ nchekwa.

Ịma atụ, ewezuga ndị oyindụegwu Boko Haram na ISWAP, e nwere ndị ntọ mmadụ na-atọ mmadụ maka ịnapụta ha ego isi mgbapụta.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

E nwekwara nsogbu n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo, ndị na-achọ nnwereonwe na nkewa dị n'etiti ndị ndịda na ndị ugwu na Naịjiria.

3) Mwulite ọnọdụ akụnaụba Naịjiria

O kwuru na akụnaụba obodo Naịjiria na-akpụ afọ n'ala kemgbe, dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo si kwuo.

Nke a sitere n'ọdịda mmanụ agbịdị n'ahịa mbaụwa nakwa mpụta ọrịa-ozuru-ụwa-ọnụ Covid-19 kemgbe afọ 2020.

O kwuru na etu ihe niile si arị elu na-etinye ndị Naịjiria n'ọnọdụ ọjọọ.

4) Mgbanwe ọnọdụ agụmakwụkwọ

Ọtụtụ na-ahụta ya na ọnọdụ agụmakwụkwọ na Naịjiria - site na praịmarị ruo mahadum - na-akpụ afọ n'ala, site n'ihe gụnyere enweghi ngwaọrụ, enweghi ezigbo ndị nkuzi tozuru etozu, mmebi ụfọdụ ụlọakwụkwọ nakwa ọchụchụ ndị nkuzi na-anaghị eme ọfụma. Nke a ejula ndị Naịjiria anya.

A bịa na ogogo mahadum, oke abụbụọrụ ndị nkuzi na-agba n'ihi ụgwọ ọnwa e ji ha, emeela ka ọtụtụ ndị kwesịrịla ịgụcha mahadum ka tọ n'ụlọakwụkwọ ebe ndị ọhụrụ kwesịrị ịbata mahadum ahụghị ụzọ bata.

5) Mmegharị iwu obodo Naịjiria

Ndị omeiwu Naịjiria ebinyela aka n'okwu dị iche iche e kwesịrị ime iji megharịa iwu Naịjiria.

Site na ntuliaka imeụlọ PDP mere, e nwere nkewa n'etiti ndị otu ha, mana Atiku kwuru na ha ehiwela kọmitii ga-eleba anya n'ihe kpaliere okwu ma hụ na udo na ịdịnotu lọghachịtara n'etiti ndị pati ahụ.

"Enweghi etu nnukwu pati dị ka PDP ga-esi mee ntuliaka na-enweghi nsogbu ọbụla. Anyị ka na-akpa, n'aha Chineke anyị ga-emezi," ka Atiku kwuru.

Pati niile nọ na Naịjiria emechaala ntuliaka imeụlọ ha, ma kwuo na ha dị njikere maka ntuliaka afọ 2023 na-abịa.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola na ọgụ a ga-esi ike n'etiti ndị All Progressives Congress (APC) na ndị PDP.