Mba UK arịọla Peter Obi mgbaghara? Lee ihe anyị ma

Mgbe Obi mere njem na mba ofesi

Ebe foto si, Peter Obi

Otu Labour Pati ekwuola na Peter Obi ji aha ha zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’afọ 2023 amaghị maka arịrịọ ọbụla mba UK rịọrọ ya maka etu ndị ‘immigration’ ha si jichie ya n’ọdọụgbọelu’ Heathrow dị na Lọndọn n’ụbọchị 7 Eprelụ 2023.

Onyeisi mgbasaozi achụnta vootu ya Diran Onifade kwuru “anyị na-achọ ime ka ọha mata na anyị amaghị maka arịrịọ ọbụla maọbụ kwuo ihe ọbụla banyere ya.”

N’okwu ya, Onifade sị na o kwenyere na mba UK ga-eme eleba anya n’okwu a.

“Peter Obi na Labour Pati echefuola maka ihe a mere ma na-elekwasị anya n’okwu banyere ntuliaka e mere bụ nke nọ n’ụlọikpe ugbua na ụzọ ha ga-eji weghachite vootu ndị a tụrụ ya na ntuliaka ọnwa Febụwarị.

Cheta na akụkọ a na-amaghị ebe o si kwuru na gọọmentị mba UK arịọla Obi mgbaghara maka ndị ọrụ ha ijichi ya n’ụzọ na-adịghị maka ebubo ịgba mkpị nke ha sị na mmadụ na-eṅomi ya na mba ha.

Ihe a sị Peter Obi gabigara n’aka ndị 'immigration' na Lọndọn

Peter Obi ji aha Labour Pati zọo ọkwa onyeisiala Naịjirịa

Otu n’ime ndị na-ekwuru Peter Obi kọwara ihe Obi gabigara n’aka ndị uweojii n’ọdọụgbọelu Heathrow dị na mba Briten.

Diran Onifade n’ozi o wepụtara na Wenezde kwuru ndị a jidere Obi ma gbaa ya ajụjụọnụ maka ebubo ịgba mkpị (impersonation) ma kwuo na o nwere onye na-eṅomi ya.

Onifade sị na ihe zọrọ Obi n’aka ndị ọrụ nchekwa Briten a bụ ndị Naịjirịa nọ n’ọdọụgbọelu Heathrow mgbe ihe a na-eme.

‘Ebubo na mmadụ na-eṅomi Peter Obi’

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onifade kwuru na Obi wuchiri n’ọdọụgbọelu Heathrow n’ụbọchị 7 Eprelụ, 2023 ma kwụrụ n’ahịrị dịka ndị ọzọ mgbe ndị ọrụ nchekwa ‘immigration’ mba Briten jidere ya.

“Ha malitere ịgba ya ajụjụọnụ ruo ọtụtụ oge mana dịka onye ọtụtụ ndị mmadụ maara ihu ya nke ọma, ndị Naịjirịa na mba Afrịka ọzọ nọ ebe ahụ malitere ime mkpọtụ na-ajụ ihe mere e jiri nwuchie ya.

“Ọ bu mgbe ahụ ka ndị nchekwa ahụ kwuru ihe mere ha jiri nwuchie ya, na ọ bụ maka ebubo mmadụ iṅomi ya (Impersonation).”

Kamgbe akụkọ a pụtara, Peter Obi ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya. Otu n’ime ndị mgbasaozi achụnta vootu ya bụ Tanko Yunusa azaghị oku BBC Igbo kpọrọ ya banyere okwu a.

Mana otu onye dị Obi nso bụ Chinyere Stella Okunna depụtara n'akara Facebook ya n'ụbọchị 14 Eprelụ 2023 ma sị na Obi ji ọnụ ya kọọrọ ya ihe a ọ gabigara n’aka ndị a mgbe o mere njem na mba UK.

Okunna kwuru n’ebe ihe a nọ dị njọ bụ na onye ahụ na-eṅomi Obi nwereike iji njirimaara Obi kpaa arụ dị iche iche nke ga-eme ka ọ dị n’isi Obi.

O kwuru na ọ bụ ihe mwute na otu nwoke na-ata ahụhụ ndị a maka na ọ pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala ka ndị ọzọ si pụta.

Okunna gara n’ihu sị na Obi agwaghị ya kọọrọ onye ọbula kama na obi ekweghi ya ka ọ ghara ikwupụta ya.

Ozi o depụtara maka ihe mere Peter Obi

Ebe foto si, Chinyere Stella Okunna

"Ọ bụ mwakpo ka a na-eme Obi"

Ụlọọrụ mgbasaozi Peter Obi sị na nke a abụghị mbụ ndị otu ha na-agabiga mwakpo kamgbe e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala na 25 Febụwarị 2023 bụ nke ọ gbara onye atọ n’ime mmadụ iri na asatọ.

Ha kwuru na “ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nakwa ndị mba ọzọ hụrụ ka ntuliaka si gaa kwenyere na nrụrụaka dị na ya”.

Ha kwuru na kamgbe a gwara Obi gaa n’ụlọikpe bụ nke o merela na a wakpoola ya site n’ọtụtụ ụzọ.