Etu Peter Obi si mee njem gaa Borno n'obodo Chibok, Gwoza na ebe ndị ọzọ Boko Haram kpara ike

Peter Obi gara na mpaghara Southern Borno Steeti

Ebe foto si, Olusegun Dosunmu

Peter Obi bụ onye ji aha Labour Pati azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa emeela njem gaa na mpaghara Borno South bụ ebe ndị oyi ndụ egwu Boko Haram kachasị akpa ike na Naịjirịa.

Njem a Obi gara n’ebe a kpọrọ ‘Biu Emirate’ ga-eme ka ọ bụrụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala mbụ na Naịjirịa ga-eme njem na mpaghara ahụ.

Mgba Obi wuchiri ebe ahụ

Ebe foto si, Olusegun Dosunmu

Obi jupụtara ndị obodo Chibok, Gwoza, Hawl, Askira Uba na-aṅụrị maka ha atụghị anya na onye dị ka Peter Obi ga-abịa ileta ha anya.

Obi gwara ndị bi na mpaghara ahụ sị “Abụ m otu n’ime unu, ahụhụ unu na-ata na-emetụ m. Amaara m na unu na-agba mbọ na-achọkwa ịlaghachị n’ọrụ ugbo unu.

“Ana m ekwe unu ngwa na ọnọdụ nchekwa ọjọọ a ga-eji n’ọchịchị m, na-asịkwa na ọchịchị m ga-enye unu ndụ dị mma.

“Unu emeela maka mbọ niile unu na-agba na mba anyị a, agaghị m echefu unu.”

Njem Obi mere na Southern Borno

Ebe foto si, Olusegun Dosunmu

Ndị obodo ahụ kelekwara Obi maka ị bịa leta ha na mberede ma sị na ha ga-akwado ya n’ọkwa Onyeisiala ọ na-azọ.

Ebe Peter Obi na-agwa ọha okwu n'ọgbakọ na Bọrọnu n'ụbọchị Tozdee 26 Jenụwarị 2023

Ebe foto si, Segun Dosunmu

Nkọwa foto, Ebe Peter Obi na-agwa ọha okwu n'ọgbakọ na Bọrọnu n'ụbọchị Tozdee 26 Jenụwarị 2023

Ndị so Peter Obi mee njem a bụ osote ya bụ Datti Yusuf Baba-Ahmed, onyeisi Labour Pati bụ Julius Abure, onye na-azọ ọkwa gọvanọ Borno n’aha Labour Pati bụ Ibrahim Mshelia nakwa onye haziri ya bụ njem bụ Isaac Balami na ndị ọzọ.

Cheta na Obi malitere achụnta vootu ya na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa n’ime izuụka ole na ole gara aga.

Ndị bi na mpaghara ahụ

Ebe foto si, Olusegun Dosunmu

Mpaghara Southern Borno so n'ebe ndị oyi ndụ egwu Boko Haram kpara ike n'ihe dị ka afọ 2014 bụ ebe ha kpachiri ọtụtụ obodo dị n'ebe ahụ.

Ọ bụ n'oge ahụ ka wuchiri n'ụlọakwụkwọ Sekọndịrị ụmụnwaanyị dị n'obodo Chibok ma tọrọ ụmụakwụkwọ dị 276 n'ụbọchị 14 Eprelụ 2014.

Ndịagha nakwa gọọmentị Naịjirịa gbapụtara ụfọdụ n'ime ha ebe a kajichiri ọtụtụ ndị ọzọ rute ugbua.

Ndị obodo ji obi ụtọ nabata ya

Ebe foto si, Olusegun Dosunmu