Gịnị nọ n'iwu ga-amachi iji Bekee akuzi ihe n'ụlọakwụkwọ praịmarị?

Nwata akwụkwọ

Ebe foto si, Iwaria

Mịnịstrị agụmakwụkwọ Naịjirịa akọwarala BBC Igbo etu iwu ọhụrụ ha wepụtara banyere asụsụ aga eji na-akụzịrị ụmụakwụkwọ praịmarị ihe n’ụlọakwụkwọ niile nọ na Naịjriịa ga-esi dị ire.

Otu ọnụ na-ekwuru ha nke ngabala mgbasaozi ha bụ Bem Goong gwara BBC Igbo na ya bụ iwu “ga-ahụ na ndị nkuzi ji asụsụ a na-asụ n’obodo ọbụla nwata nọ nwere na-ekuziri ụmụakwụkwọ prịamarị ihe.”

“Ọ bụghị naanị asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba ka ma ọ ga-emetụta asụsụ niile a na-asụsụ niile nọ na Naịjirịa. Iji maa atụ, ọ bụrụ na nwata nọrọ na Benue steeti ebe e nwere asụsụ ndị Tiv nakwa nke ndị Idoma, a ga-eji asụsụ nke obodo ọ nọ n’ime ya kuziere ya ihe.”

“Ụmụaka anaghị enwe nsogbu na mmụta ọtụtụ asụsụ n’ihi

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Goong gara n’ihu kọwaa na atụmatụ agaghị ekpọsa atụmatụ njikọ nakwa ịdịnatọ Naịjirịa kama ọ ga-enyere aka hụ na ndị Naịjirịa mụtara asụsụ ha n’uju.

O kwukwara na olu ndị na-enyere ụmụaka aka n’ọmụmụ nakwa mmụta n’ihi nke a bụ asụsụ ụmụaka na-asụkarị n’ezinụlọ ha.

Iji saa etu ndị nkuzi na-abụghị ndị agbụrụ obodo maọbụ ala ebe ha na-arụ ọrụ ga-esi mụta asụsu ala ahụ, o kwuru “Minista agụmakwụkwọ ehibela atụmatụ inyereka kuziere ndị nkuzi ndị a asụsụ nakwa usoro ọrụ ọhụrụ ndị a”

Agbanyeghị na ọ zaghị maka ndị ntorobịa na-efe ala nna ha a na-eziga n’ụlọakwụkwọ dị iche iche maka inyereaka na nkuzi, ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ anya na mgbe atụmatụ a malitere n’uju na a ga-anụ etu aga esi hazịe nke a.

Ihe kpatara okwu a bụ na gọọmenti Naijiria kwupụtara n’ụbọchị Wenezde atụmatụ ọhụrụ ka akwụsị iji asụsụ Bekee kuziere ụmụakwụkwọ praịmarị ihe n’ụlọakwụkwọ.

Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Adamu Adamu gwara ndị ntaakụkọ nke a mana ministri ya ekwubeghị mgbe ya bụ iwu ga-amalite n’uju.

Nwata akwụkwọ

Ebe foto si, Iwaria

Maka asụsụ na Naịjirịa

Naịjirịa nwere asụsụ ruru 600. Asụsụ gọọmentị Naịjirịa nabatara nke e ji eme mgbasaozi n’akụkụ Naịjriịa niile bụ Bekee nke bụ asụsụ mba Briten ndị chịrị n’oge gara aga ji na-agbasaozi ma na-enwe nkwukọrịta n’ihu ọha n’oge ọchịchị ha.

Dịka otu ngụkọ e mere n’afọ 2003 siri kwuo, nde mmadụ 60 na-asụ Bekee egbujiri egbuji nke a na-akpọ ‘Nigerian Pidgin English’ mana ejighi enwe nkwụkọrịta n’ụlọọrụ maọbụ ọgbakọ ndị welitere isi.

ụAsụsụ ndị agbụrụ pere mpe nọ n’ọnọdụ ọtụtụ na-ekwu dị egwu dịka Unesco kwuru na nso nso a ọkara asụsụ 6,000 dị n'ụwa nwereike bụ ihe lara ala n’oge adịghị anya nke metụtara ụfọdụ asụsụ na Naịjirịa.