Onye ndị uweojii na-eche wakporo ụlọọrụ Inec n'Ọlụ, Imo Steeti

ụlọ awakporo

Ebe foto si, INEC Twitter

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ndị echere bụ ndị otu amachịrị amachị bụ Indigenous People of Bioafra nke bụ Ipob n'ịchafụ na aka ike otu a bụ Eastern Security Network(ESN) wakporo ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka nke bụ Inec n'ịchafụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Sepụtemba n'ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ.

Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam depụtara nke a n'akwụkwọ ozi ha zipụrụ ma sị na ndị a bịara n'igwe ha ma tụọ ogbunigwe arụrụ n'ụlọ n'ime ogige ụlọọrụ ahụ.

O kwuru sị, " Ha bịara n'igwe ha, na-atụ ogbunigwe ma na-agba egbe. Kama ndị uweojii ekweghị ha mezuo uche obi ha".

O kwuru na ndị uweojii nọ n'ogige ahụ gbasoro ndị omekome a egbe nke mere na ọtụtụ n'ime ha bu mgbọ n'ahụ gbafuo.

Abattam kwuru na enweghị onye nwụrụ ma sịkwa na enweghị ngwa ọgụ ọbụkla ndị ahụ nwereike ịnweta.

O sị, " Ya bụ ogbunigwe ha tụrụ emetụtaghị ụlọ Inec kama na ọ bụ ọbere ụlọ ndị nmchekwa ka ha bụ ogbunigwe metụtara ọbere.

Ọ kọwara na ha ebidola nyocha ha ma sị na ọcheghị na ndị omekome a gatere aka n'ihi etu ọbara siri ụsasịa n'ala mgbe ndị omekome a na-agba ọsọ.

N'aka nke ọzọ ka Kọmịshọna ndị uweoji steeti ahụ bụ Mohammed Ahmed Barde toro ndị uweojii etu ha siri gbochie ebum n'ụche ndị omekome a ma gbaa ha ume ka ha jisie ike hụ na-ejidere ndị omekome niile n'Imo steeti ma kpee ha ikpe etu ọ kwesịrị.

ụlọọrụ Inec awakporo

Ebe foto si, INEC Twitter

Ihe ndị ụlọọrụ Inec kwuru maka mwakpo a

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ngalaba na-ahazi ntụliaka na Naịjirịa bụ INEC n’ịchafụ ekwuola na ndị omekome awakpola ma gbaa ụlọorụ ha dị n’Orlu ọkụ.

Ha kwuru na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị na-arụgharị ụlọ atọ n’ime mmadụ asaa ma mechaa tọghapụ ha.

Kọmịshọna Inec n'Imo steeti bụ Sylvia Agu kwuru na ụlọ nke a gbara ọkụ bụ nke ndị omekome wakpoburu n'oge gara aga a na-arụgharị.

O kwukwara na mwakpo ahụ kaara ị ka njọ karịa etu ọ dị ma ewezuga ndị uweojii gbataara ha ọsọ enyemaka ozugbo ozugbo.

Nke a ga-eme ya ugboro anọ n'izuụka anọ a ga-awakpo ụlọọrụ Inec dị na steeti dị icheiche dịka awakpoburu Ogun, Osun nakwa Ebonyi steeti.