Ọ bụ eziokwu na a wakporo ndị Labour Party n'Ebonyi steeti?

Ebe foto si, Chief Nkemkanma Kama Media center
Ndị uweojii n'Ohaọzara dị n’Ebonyi steeti, ekwuola na ha amaghị ihe ọbụla gbasara mwakpo ndị Labour Party na steeti ahụ, dịka akụkọ na-efegharị si kwuo.
Nke a na-abịa dịka ndị Labour party gbakọrọ ịnabata ndị si party ndị ọzọ awụbata na nke ha, kwuru na ndị ojiegbe bịara chụsasịa ha.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe David Ogbonna jị ọkọlọtọ Labour Pati azọ ọkwa ụlọomeiwu nta n'Ebonyi Steeti kwuru mere
David Ogbonna onye jị ọkọlọtọ Labour Part azọ ọkwa ụlọomeiwu nta nke Ebonyi steeti kwuru na ha na-akwado emume ịnabata ndị si otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ abata nke ha bụ Labour party n'ụbọchị ya bụ ihe mere.
O kwuru sị, "Anyị jị ụgbọala kwụ n'ahịrị aga ya bụ emume, e nwekwara ụgbọala ndị ọzọ kwụ n'ahịrị gbafere anyị, ha ruru ụgbọala Sienna asatọ, otu bọsụ Hiace, otu ụgbọala Hyandai na Mercedes GLK 350".
"Amatara m akara ụgbọla nke Mercedes GLK 350, ọ bụ onyeisioche okpuruọchịchị Ọhaọzara aha ya bụ Aja Chinonso."
O kwuru na ya amaeghị ebe ha na-aga kama na ọ chere na ọ bụ akwamozu nwunyedi nne gọvanọ ka ha na-aga.
Ọ sị, "Ha ji ụgbọala ha dochie ụzọ ebe anyị ga-esi gafee. Onyeisioche a na ndị ha na ya so bu egbe si n'ụgbọala ha pụta, nke a mere ka anyị tinye isi ebe ọzọ, gawa ebe a na-eme akwamozu".
O kwuru na ha amaghị ihe mere ha jiri dochie ụzọ, ma sị na ndị nchekwa so ha chọrọ ịgba ndị a dochiri ụzọ ajụjụ ọnụ kama asị ha mba.
Ogbonna kwuru na ọ ga-abụ mgbe ha gawara ya bụ akwamozu ka ndị a gara wakpoo ebe ha na-awado ime emume otu patị ha.
O kwuru sị, "Akụkọ rutere anyị ntị bụ na onyeisioche okpuruọchịchị Ọhaọzara so ndị a wakporo emume a"
Ogbonna na-akọwa na akwaturu otu nwaanyị mgbe ndị mmadụ na-agba ọsọ, ma gbaa otu onye egbe n'ụkwụ.
Unu ekpesaara ndị uweojii?
Ọ zara sị, "Anyị kpesara ndị uweojii kama ha sịrị anyị gaa dee ya ede n'akwụkwọ mkpesa nke a na-akpọ 'Petittion' na bekee".
Ihe ndị uweojii kwuru maka ya bụ ihe mere
Mgbe BBC Igbo zigara ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Ebonyi Steeti bụ Chris Anyanwu ozi maka okwu a, ọ zara ma sị na DPO Ohaọzara kwuru na-enweghị mkpesa ọbụla rutere ya ma sịkwa na ya enyochaala ma ọ nweghị ihe dị etu a mere.









