Etu ị ga-esi mara na ụbụrụ nwa gị na-aghọ nkọ

Nwatakịrị ma akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụaka na-enwe oke amamihe karịa afọ ole ha dị

Na nwatakịrị nwere onyinye oke amamihe bụ ihe e nwereike ịgbagha mgbe ụfọdụ.

N'otu aka, ndị ọkammụta sayensị akwara ahụ mmadụ nakwa nke akparamagwa na ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ naanị ụmụaka echiche ụbụrụ ha (Intelligence Quotient - IQ) karịrị etu ọ kwesịrị, na-enwe ya bụ onyinye oke amamihe.

N'aka nke ọzọ, ndị ọkachamara n'echiche agụmakwụkwọ nakwa ndị na-enye ọzụzụ egwuregwu n'ịma atụ, na-ekwu na inwe ụdịrị onyinye a sara mbara, ma na-ekwukwa na ụmụaka nwere oke amamihe n'ụfọdụ ihe dị iche iche nwere onyinye.

Mkparịtaụka gbasara isiokwu a ka na-aga n'ihu ogologo oge.

Mana e nwere nkwekọrịta na ụmụaka na-anwale ule IQ iji mara ogogo amamihe ọgụgụ isi ha ruru ma nwetekarịa pasentị 97, nwere onyinye.

Ịma atụ, na mba Brazil, Theo Costa Ribeiro bụ nwatakịrị dị afọ isii si obodo Sao Paulo, nwere onyinye oke amamihe.

Ọ malitere ikwu okwu ka ọ dị naanị ọnwa isii, ka ọ dị naanị otu afọ na ọnwa isii, ọ malitela ikwuputa okwu n'ahịrịokwu ma malite ịga ụlọakwụkwọ.

Ygor Ribeiro bụ nna Theo, kwuru na "ọ hụrụ otu okwu wee na-ajụ anyị nkọwa ya bụ okwu pụtara, ya na okwu ndị ọzọ, mana ajụjụ ndị ahụ abụghị ajụjụ nzuzu."

Ygor gwara BBC na ezinaụlọ ya amanyeghi Theo ịmụta ihe ọbụla, ha elegharakwaghịnụ ajụjụ ndị o nwere anya.

Ka Theo dị afọ atọ, ọ malitelarị ịgụ akwụkwọ, ide ihe nakwa ime mgbakọ.

Ndị nkuzi bịara gwa nne na nna ya ka ha nwalee IQ ya, n'ihi na ọ na-egosi oke amamihe karịa ndị ọgbọ ya.

Nnwale a gosiri na Theo dị afọ ise mgbe ahụ, nwere amamihe kwesịrị nwatakịrị dị ebe afọ 14 - 15.

Nke a apụtaghị na ọ naghị akpa agwa ka nwatakịrị ọ bụ. Ọ na-amasị ya ime enyi ọhụrụ, ịgba game na-amasị ya, egwuregwu mmegharị ahụ nakwa iji anụmanụ dinosaur (nke a rụrụ arụ) egwu egwu na-amasị ya dịka ụmụaka ọgbọ ya.

Kedụ etu ị ga-esi mara ma nwa gị enwere onyinye oke amamihe?

Nwata akwụkwọ

Iji malite, n'agbanyeghị na ọ bụ ezigbo ihe ngosi, na nwatakịrị nwere oke amamihe anaghị akọwapụtacha na o nwere onyinye, a na-ama kpọmkwem ma e mechaa nnwale dị iche iche, ọkachasị nke IQ a na-eme iji ghọta ụdịrị ihe ụbụrụ onye ahụ nwere ike imeli.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara akparamagwa mmadụ, ndị 'neuropsychologists' na/ma ọ bụ ndị ọkachamara n'akparamagwa mmadụ na ndị ọkachamara na ngalaba a na-eme nnyocha a.

Lee ihe ndị Special Education Secretariat nke MEC (2006) rụtụrụ aka nwereike igosi na nwa gị nwere onyinye oke amamihe:

  • Nnukwu ọchịchọ ịmata (curiosity)
  • Ịma okwu (vocabulary) karịa etu ndị ọgbọ gị kwesịrị
  • Ịmụta ihe ọsịsọ nakwa inwe ikike ọgụgụ isi ebe ọ dị elu
  • Ichepụta uche ngwa ngwa
  • Ịbụ onye ndu nakwa inwe ntụkwasị n'onwe
  • Icheta ihe ọsịsọ
  • Ịbụ onye mmepụta ihe na-agara ọfụma (creativity)
  • Ikike imegharị ma ọ bụ gbanwee echiche ị chepụtara
  • Inyochapụta ihe dị omimi
  • Ịgba isi akwara n'inweta ihe ị na-achọ
Nwatakịrị na-apị kọmputa

N'aka nke ọzọ, e nwekwara ụmụaka nwere onyinye oke amamihe a na-amaghị na ha nwere ya bụ onyinye.

Ụfọdụ oge ha anaghị enwe mmasị ịga akwụkwọ, ụfọdụ oge ha na-enwekwa nsogbu akparamagwa.

"E nwere ọtụtụ ndị nwere onyinye oke amamihe na-anaghị eme ọfụma n'ụlọakwụkwọ n'ihi na uche ha adịghị n'agụmakwụkwọ, nakwa n'ihi na enweghi ihe na-akpalite uche ha. Ụfọdụ oge nkuzi na nkuzigharị a na-eme n'ụlọakwụkwọ na-atakasị ha ahụ ma ghara ị na-emelite ihe ha pụrụ ime," ka Fabiano de Abreu bụ dọkịta n'ihe gbasara 'neuroscience' kwuru.