Ọ bụghị eziokwu na a nwụchiri otu onye ọkwọụgbọelu maka ibunye ndị 'bandit' ngwaagha na Naịjiria

Ebe foto si, Screenshot
Site n'iji ngwaọrụ e ji atụgharị foto eme nchọpụta, ngalaba Disinformation Unit nke BBC achọpụtala na akụkọ na-efegharị na a nwụchiri onye ọkwọụgbọelu na-ebunye ndị omekome 'bandit' ngwaagha na Naịjiri, bụ akụkọ ụgha.
E sere ya bụ foto nke onye a sị bụ ọkwọụgbọelu n'afọ 2021, na Bangui, isiobodo mba Central African Republic.
Ya bụ akụkọ nke gbarala na n'ụfọdụ ọbantaakụkọ n'ịntanetị nakwa na-efegharị na soshal midia, gosiri Juan Rémy Quignolot bụ onye mba France, mgbe a nwụchiri ya maka ibu egbe na-enweghi ikikere ya, n'ọnwa Mee nke afọ 2021.
Quignolot nọ na foto dị iche iche ya na ndị uweojii nke Central Office for the Suppression of Banditry (OCRB) sere ka a nwụchiri ya na Bangui, ya na egbe dị iche iche, mgbọ nakwa ngwaọgụ ndị agha.
Mgbe mbụ foto nwụchi Quignolot gbara n'ịntanetị site na nchọpụta BBC Disinformation Unit mere, bụ nke Banguiwood Media tinyere na Facebook n'elekere 6:42 mgbede, n'ụbọchị 10 nke ọnwa Mee, 2021.
Rodriquez Katsuva, bụ onye ntaakụkọ na mba Congo, kekwara otu n'ime foto ahụ na Twitter ya otu ụbọchị ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Katsuva gwara BBC Disinformation Unit na n'Afrịka, ọ bụghị ihe ọhụrụ iwere akụkọ fesaa ya ka akụkọ ụgha na mba ọzọ.
Ọ sị "N'ihi na ọ dịtu nso otu ebe, ndị mmadụ nwere otu agwa anụ ahụ ma na-eyikwa ihe yituru otu ụdịri uwe, e nwere ike iji foto si mba ọzọ dee akụkọ ụgha ma gosi ya dịka o si na mba dị iche iche n'Afrịka".
O kwukwara na nke a abụghị mbụ a na-eji akụkọ si na mba Central African Republic kesaa akụkọ ụgha na Naịjiria.
Ọ sị, "Echetara m otu helịkọpta ndị NGO dị na Central African Republic e bugharịrị akụkọ gbasara ya na Naịjiria nakwa mba Mali.
Ya bụ akụkọ ụgha a na-ekesasị na Naịjiria kwuru sị na Quignolot bụ "ọkwọụgbọelu helịkọpta na-ebunye ndị bandit ngwaagha".
Ya bụ akụkọ ụgha efesasịala, ebe ụfọdụ akụkọ gbasara ya na Facebook nwere ndị kerela ya ugboro 1600, dịka ihe karịrị mmadụ 500 tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Ụlọntakụkọ Euro News kwuru n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Septemba 2021, na gọọmentị the Central African Republic boro Quignolot ebubo ibu agha megide gọọmentị nakwa iji egbe n'ụzọ iwu akwadoghi.









