Fake News: Foto na-ekwu na ndị agha na-emekpa ndị okenye ahụ n'Abịa steeti abụghị eziokwu

Akụkọ ụgha gbasara ndị agha n'Abia steeti

Ebe foto si, screengrab

Foto na-efegharị ugbua na soshal midia nke na-egosi ebe ndị agha na-emekpa ndị okenye ahụ abụghị na Naịjirịa ka o mere, nke o ji abụ n'Abịa steeti.

Akụkọ ụgha ahụ na-efegharị na-ekwu na ọ bụ n'Abia steeti ka ndị agha Naịjirịa na-emekpa ndị okenye Igbo ahụ mana egbu ha.

Otu akara facebook kesara akụkọ ụgha a kwuru na ya bụ ihe mere taa bụ Wenezde, ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst, 2022.

Mana nnyocha nke ngalaba 'BBC Disinformation' mere gosiri na ebe e sere foto ahụ bụ na mba Kemerun, n'afọ 2020.

fake news

Ebe foto si, screengrab/facebook

Anyị chọpụtakwara na ndị agha nọ na foto ahụ bụ ndị otu a kpọrọ 'Rapid Intervention Battalion' (BIR).

Ndị okenye nọkwa na foto ahụ bụ ndị a zọpụtara n'aka ndị ọgụ nnupuisi na mba Kemerun.

BBC ji akụrụngwa tekịnụzụ nyochaa foto ahụ wee chọpụta na ọ bụ n'ụbọchị 16 nke Ọnwa Ọkutoba 2020 ka foto ahụ bu ụzọ pụta na Facebook.

Ndị agha Kemerun

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto a gosiri n'ezie na akwa ndị agha yi na foto ahụ bụ akwa ndị agha BIR nke mba Kemerun

Nnyocha akwa ndị agha nọ na foto ahụ gosikwara na ọ bụ ụdị akwa nke ndị agha BIR nke mba Kemerun na-eyi.

N'otu aka ahụ kwa, ọbaozi ntaakụkọ mba Kemerun a na-akpọ kontripipo.com dere akụkọ gbasara foto ahụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Ọkutoba 2020.

Ihe mere na Kemerun na 2020

Ebe foto si, screengrab

Nkọwa foto, Foto ndị a na-egosi oge akụkọ a bu ụzọ pụta n'afọ 2020, nakwa foto ndị ọzọ so ya n'oge ahụ.

Kemerun na Naịjirịa nwere okeala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọtụtụ mpaghara dị na Kemerun yikwara mpaghara ụfọdụ na naịjirịa.

Naịjirịa na Kemerun na-enwekwa nsogbu ndị nnupuisi na-achọ nnwereonwe, nke mere ụdị akụkọ ụgha ndị a ji apụtakarị na mba abụọ a.

Akụkọ ụgha

Ebe foto si, screengrab/facebook