Etu ndị ojiegbe si chụsaa ndị mmadụ, gbaa ụlọ ọkụ n'Izombe

Ụlọ na-agba ọkụ

Ebe foto si, Chinedu Nnadi

Ndị mmadụ bi n'obodo Izombe nke dị na mpaghara Oguta, Imo steeti, nọrọ n'oke egwu n'ụbọchị Tọzde dịka ndị ojiegbe wakporo obodo ha, chụsaa ndị mmadụ, ma tinye ụfọdụ ụlọ ọkụ.

Otu onye bi n'obodo ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị n'ekwentị na ya bụ ihe akarịala n'obodo ha.

Amabeghị kpomkwem ndị wakporo obodo Izombe nke ugbua, mana ndị obodo ahụ na-ebo ebubo na ọ bụ ndị ọrụ nche a na-akpọ Ebube Agu.

Onweghị onye ma ndị na-achịkọta otu Ebube Agu n'Imo steeti, mana oge anyị kpọrọ ndị uweojii, ọnụ na-ekwuru ha bụ Michael Abattam kwuru ka anyị kpọghachi ya azụ maka na o ji ọrụ n'aka.

Abattam asaghịkwa ozi anyị zigaara ya n'ekwentị gbasara mwakpo a.

Ebe ọkụ na-agba

Ebe foto si, Chined Nnadi

Nkọwa foto, Ụlọ ebe ndị ojiegbe tinyere ọkụ n'Izombe

Onye obodo Izombe aha ya bụ Chinedu Nnadi ji anya mmiri kpọkuo ndị welitere isi n'obodo Izombe ka ha gakwuru gọọmentị Imo steeti ka a mara etu udo ga-esi laghachi n'obodo ha.

"Obi m na-agba ọbara, obodo m bụ Izombe bụbu ebe udo na-achị, mana ugbua ndị Ebube Agu amụnyela ya ọkụ," Nnadi kwuru na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ anyị.

"Ebee ka ndị welitere isi na be anyị n? General Kalu, Ifeobu, Dibiagwu, ebee ka ụnụ nọ?"

"Oge eruola mgbe ụnụ ga-ekuli lee gọọmentị anya n'ihu ma gwa ha nke bụ eziokwu."

Ugboro ole awakporola obodo Izombe

ụgbọala a gbara ọkụ n'Izombe n'ọnwa June 2022

Nke a abụghị mbụ nke ọ na-abụ nke abụọ ndị ojiegbe na-awakpo obodo Izombe.

Ọtụtụ oge, ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị ekperima ji mpaghara ahụ mere isi ụlọọrụ ha, mana ndị obodo na-ekwu na ọ bụ ndị ọrụ gọọmentị, ọ kachasị ndị 'Ebube Agu', na-eyi ndị be ha egwu.

N'Ọkụtoba 2021, ndị agha Naịjiria wakporo obodo Izombe n'ihi ogbugbu e gburu otu onye otu ha n'ebe ahụ.

Na Jun afọ a, ndị ojiegbe wakporo ahịa Ogboroafor dị n'Izombe n'otu ụbọchị Mọnde, iji manye ndị mmadụ ka ha rube isi n'iwu 'sit-at-home'.

N'ọnwa Ọgọst 2022, ndị ojiegbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Izombe.

Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị ọgụ nnupuisi IPOB mere mwakpo ahụ.