Xi Jinping: Ihe ị kwesịrị ịma maka onyeisiala mba China

Ebe foto si, Reuters
Aha Xi Jinping bụ aha ọtụtụ ma ama n’ụwa dịka ọ bụ onyeisiala mba Chaịna kemgbe afọ 2012.
Xi gbara afọ 69 bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n’ọkwa ọdeakwụkwọ ukwuu nke otu pati Chinese Communist Party (CCP) nakwa onyeisioche Central Military Commission (CMC).
Ihe ndị dị mkpa banyere ndụ na ọchịchị Xi Jinping

Ebe foto si, Reuters
- Nna ya bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị nke otu ndị Communist a ma ama dịka Xi Zhongun
- Nna ya chụpụrụ ya n’obodo ma chụga ya obodo Yanchuan County mgbe ọ na-agbanwe echichi usoro ọchịchị ebe ahụ
- Ọ banyere otu CCP mgbe ọ ka bụ obere onye ntorobịa ma rụọ ọrụ dịka ọdeakwụkwọ patị ahụ
- Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Tsinghua University bụ ebe ọ natara ọzụzụ na ngalaba ‘Chemical engineering’
- Ọ mechara bụrụ gọvanọ Fujian malite n’afọ 1999 ruo afọ 2002
- Ọ rụkwara ọrụ dịka gọvanọ Zhejiang ma rụkwa ọrụ dịka ọdeakwụkwọ pati ya malite na 2002 ruo 2007
- Mgbe a chụrụ Chen Liangyu bụ ọdeakwụkwọ pati ha na Shanghai n’ọrụ, Xi nọchịrị ya nwa mgbenta n’afọ 2007
- A họpụtara ya dịka osote onyeisi otu Politburo Standing Committee (PSC) nakwa osote onyeisi oche Central Military Commission
- Etu o si buso nrụrụaka agha mere achụpụ ọtụtụ ndị isi otu PSC
- Xi bụ onyeisiala mba Chaịna nke asaa
- N'afọ 2018, ụlọ omeiwu mba Chaịna tinyere iwu ọhụrụ nke wepuru ugboro ole mmadụ nwereike ịzọ ọkwa onyeisiala, nke a pụtara na Xi Jinping nwere ike ịbụgide onyeisiala ruo n'ọnwụ ya.
- Xi Jinping na nwunye ya bụ Peng Liyuan mụtara naanị otu nwa nwaanyị
Mmekọ ya na ndị mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mba ụwa dị icheiche na-akwanyere Xi Jinping ugwu dịka onyeisiala mba so na mba ndị kachasị ike n'ụwa.
N'ime mba 193 dị n'ụwa, Chaịna na mba 178 nwere mmekọrịta azụmahịa; onweghị mba ọzọ nweruru otu a.
Mana n'ọdị nso, a na-ebo Xi Jinping ebubo aka ike na mmekpa ahụ megide ndị agbụrụ Uyghur, Kazakh, Kyrgyz, na ndị okpukperechi alakụba na mba Chaịna.
Kama ọ gọrọ agọ banyere ebubo ndị a.
Mmekọ ya na ndị mba Afrịka

Ebe foto si, AFP
Xi Jinping nwere nnukwu mmasị n'ebe Afrịka nọ, nke mere mba Chaịna ji enye ọtụtụ mba Afrịka ihe enyemaka dị icheiche n'ụdị mgbazinye ego, ịrụrụ ha okporo ụgbọoloko, maọbụ ọdọ ụgbọelu na ihe ndị ọzọ.
Naanị otu mba n'Afrịka jụrụ ka ha na Chaịna nwee mmekọrịta azụmahịa, mba ahụ bụ Eswatini.
Afrịka so n'otu mpaghara ebe mba Chaịna kacha ere ngwaahịa dị icheiche ha na-arụpụta.
Ọ bụ Chaịna rụrụ isi ụlọọrụ otu jikọrọ mba Afrịka niile bụ African Union, nke dị n'Addis-Ababa Ethiopia, ma nye ya Afrịka dịka onyinye.
Ọnụego e ji rụọ ya bụ ụlọ bụ narị nde dọla abụọ (US$200).
N'aka nke ọzọ Chaịna na-esi n'Afrịka azụta mmanụ agbịdị, kọtịn, Iron ore na ihe akụ ọnatarachi ndị ọzọ.
Mba Saụt Afrịka, Ethiopia, Angola na Naịjirịa bụ mba Afrịka ha na Chaịna kacha azụkọrịta ahịa.









