Interpol wanted list: Lee ihe mere Interpol jị achọ ndị Naijirịa 16 a achọ

Ngalaba uweojii zuru ụwa ọnụ bụ International Crominal Police Organisation bụ Interpol edepụtala aha mmadụ iri na isii bụ ụmụ afọ Naijirịa a na-achọ achọ maka arụ ha kpara.

Dịka etu Interpol si arụ ọrụ ha, ha na mba ruru otu narị na iri itolu na ise na-arụ ọrụ iji hụ na nchekwa zuru ụwa ọnụ.

Dịka o siri dị ha bipụtara aha mmadụ puku asaa, otu narị na iri asaa na abụọ ndị a na-achọ achọ n'ụwa niile.

N'ime aha ndị a , mmadụ iri na isii bụ ụmụ afọ Naijirịa.

Ụfọdụ ndị Naijirịa Interpol na-achọ achọ

Ebe foto si, Interpol

Ihe mmadụ 16 mere eji achọ ha ọnwụ na ndụ

EDOSOMWAN, JESSICA ESOHE

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, EDOSOMWAN, JESSICA ESOHE

Mba na-achọ ya : Fransị

Aha nna ya: Edosomwan

Aha mbụ ya: Jessica Esohe

Ụbọchị ọmụmụ ya: 02/07/1993 (Ọ dị afọ 29)

Ebe a mụrụ ya: Bini, Naijirịa

Mba: Naijirịa

Ebubo mere eji achọ ya: Izopụ ego n'ụzọ ezịghị ezi, ịhazi usoro eji esopụ ego enwetara site na nrụrụaka.

EGBUE, BONIFACE UCHE

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, EGBUE, BONIFACE UCHE

Mba na-achọ ya : Argentina

Aha nna ya: Egbue

Aha mbụ ya: Boniface Uche

Ụbọchị ọmụmụ ya: 07/03/1964 (Ọ dị afọ 58)

Ebe a mụrụ ya: Ahoada, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : Spanish, English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: Iji ụzọ ahụghọ ebubata ibu na mba ọzọ.

UZOMA ENEH, JUDE

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, UZOMA ENEH, JUDE

Mba na-achọ ya : Brazịl

Aha nna ya: Uzoma Eneh

Aha mbụ ya: Jude

Ụbọchị ọmụmụ ya: 11/08/1973 (Ọ dị afọ 49)

Ebe a mụrụ ya: Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : Spanish, English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: Ịgba mgbere ọgwụike site mba ruo mba

ASUQUO, MBUOTIDEM EDEM

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, ASUQUO, MBUOTIDEM EDEM

Mba na-achọ ya : Gana

Aha nna ya: Asuquo

Aha mbụ ya: Mbuotidem Edem

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/03/1989 (Ọ dị afọ 33)

Ebe a mụrụ ya: Akparboyu, Krọs Riva Steeti, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Izu ohi na ịwakpo nwaanyị n'ike

EZEKWEM, CHARLES CHINWEIKPE

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, EZEKWEM, CHARLES CHINWEIKPE

Mba na-achọ ya : Equatorial Guinea

Aha nna ya: Ezekwem

Aha mbụ ya: Charlse Chinweikpe

Ụbọchị ọmụmụ ya: 27/09/1992 (Ọ dị afọ 29)

Ebe a mụrụ ya: Okponkume, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igbu ọchụ

Charlse Chinweikpe

Ebe foto si, interpol

Nkọwa foto, Charlse Chinweikpe

Mba na-achọ ya : Uruguay

Aha nna ya: Ezunara

Aha mbụ ya: Festus Chinedu

Ụbọchị ọmụmụ ya: 29/05/1985 (Ọ dị afọ 37)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere ọgwụike (2) I sonye na otu ndị omekome

OKORO, BENEDICT

Ebe foto si, interpol

Nkọwa foto, OKORO, BENEDICT

Mba na-achọ ya : Nicaragua

Aha nna ya: Okoro

Aha mbụ ya: Benedict

Ụbọchị ọmụmụ ya: 01/05/1967 (Ọ dị afọ 55)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English,Spanish, French

Ebubo mere eji achọ ya: Isonye n'otu ndị omekome

OBIDIOZOR, MALAHI IKECHUCWU

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, OBIDIOZOR, MALAHI IKECHUCWU

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Obidiozor

Aha mbụ ya: Malahi, Ikechukwu

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/06/1979 (Ọ dị afọ 43)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

STANLEY, NWOKORIE ALCACHI

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, STANLEY, NWOKORIE ALCACHI

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Stanley

Aha mbụ ya: Nwokorie, Alcachi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 09/01/1972 (Ọ dị afọ 50)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

VITUS, AKACHI

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, VITUS, AKACHI

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Vitus

Aha mbụ ya: Akachi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 13/04/1984 (Ọ dị afọ 38)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

EZE, MARY

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, EZE, MARY

Mba na-achọ ya : Denmark

Aha nna ya: Eze

Aha mbụ ya: Mary

Ụbọchị ọmụmụ ya: 01/04/1973 (Ọ dị afọ 49)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere mmadụ

SALIF, BOUHARI

Ebe foto si, interpol

Nkọwa foto, SALIF, BOUHARI

Mba na-achọ ya : China

Aha nna ya: Salif

Aha mbụ ya: Bouhari

Ụbọchị ọmụmụ ya: 04/09/1971 (Ọ dị afọ 50)

Ebe a mụrụ ya : Zinder, Naịja Steeti

Mba: Naịjirịa, Nijee

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbereọgwụike

NKEM, BUTCHANG TIMLOH

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, NKEM, BUTCHANG TIMLOH

Mba na-achọ ya : Canada

Aha nna ya: Nkem

Aha mbụ ya: Butchang Timiloh

Ụbọchị ọmụmụ ya: 25/11/1988 (Ọ dị afọ 33)

Ebe a mụrụ ya : Libreville Gabon/Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Ịdịna mmadụ n'ike na erubeghị isi nkwekọrịta ụlọikpe nke kwuru na onye ahụ agaghị agba ọsọ na ihe ndị ọzọ

ADESINA, IFAKEMI

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, ADESINA, IFAKEMI

Mba na-achọ ya : Brazil

Aha nna ya: Adesina

Aha mbụ ya: Ifakemi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/05/1970 (Ọ dị afọ 52)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere ọgwụike site na mba gaa na mba

COSTA, DA COSTA FRANKLE AUSTINE

Ebe foto si, Interpol

Nkọwa foto, COSTA, DA COSTA FRANKLE AUSTINE

Mba na-achọ ya : India

Aha nna ya: Costa

Aha mbụ ya: Da Costa Frankle Austine

Ụbọchị ọmụmụ ya: ---/--/1963 (Ọ dị afọ 59)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Njirimara ya: O nwere ihe mmerụ ahụ dị nsọ anya ya nke aka nri, ọ nwere ihe mmerụ ahụ na ntị nke aka nrị ya

Asụsụ ọ na-asụ : Niger-Kordofanian ( na ọzọ)

Ebubo mere eji achọ ya: Iji akwụkwọ adigboroja ma chọrọ iji ya mee ihe, ịrụpụta akwụkwọ adigboroja nke onye nwụrụ anwụ ji eke ihe ọ nwere, ịkpa nkata iji akwụkwọ adigboroja zuo ohi

OKROMI, FESTUS

Ebe foto si, Interpol

Mba na-achọ ya : India

Aha nna ya: Okromi

Aha mbụ ya: Festus

Ụbọchị ọmụmụ ya: 26/06/1965 (Ọ dị afọ 57)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Njirimara ya: O nwere ihe mmerụ ahụ dị nsọ anya ya nke aka ekpe

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Ikpa nkata izu ohi na nrụrụaka