Siera Leone attempted Coup: Ihe butere ya nakwa ihe ndị ọrụ nchekwa na-eme banyere ya

Ebe foto si, EPA
Ndị uweojii na Sierra Leone ekwụọla na ha na-achụ nta ndị wakpọrọ isiobodo ha,ihe gọọmentị kọwara dị ka mwakpo adị ịgwe mmadụ nwere weputa atụmatụ ya.
Ndị ji egbe wabara n'ebe a na-adọba ngwaagha na ọtụtụ ụlọmkpọrọ dị na Freetown n' Ụbọchịụka, mee ka ndị nga fọrọ obere ka ha rue mmadụ puku abụọ gbafuo.
Ndị ọchịchị mba Sierra Leone na-enye ego ruru puku dọla abụọ (£ 1,580) maka onye ọbụla nwere ozi gbasara onye maọbụ ndị so mee ya bụ mpụ, ya na $1,000 maka ịgọsị ndị mkpọrọ gbapụrụ agbapụ.
A ka nwere iwu ejịrị machịe ịje abalị na Sierra Leone dum.
Mmadụ iri abụọ nwụrụ na mwakpo a, madụ iri na ato n'ime ha bụ ndị ọrụ na-erubere gọọmentị isi.
Ihe e chere butere ọgbaaghara na Mba Sierra Leone
Dịka onye ntaakụkọ BBC na mpaghara ỌdịdaAnyanwụ bụ Mayeni si kwuo, Valnora Edwin bu onye na-akwado ọha na eze na onye nnyocha ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Sierra Leone kwuru na kwa Ụbọchị, izu, na ọnwa gara aga na enweghị ihe ngosirị na ihe dị otu a ga-eme.
Mana ileghachi anya azụ mgbe ị na-ejikọta ihe mere ọnụ, ị ga-achọpụta na e nwere nnukwu enweghị afọ ojuju na ihe nwere ịke ịbụte ya bu ọgbaaghara.
Sierra Leone prison breaks: Ndị agha 13 anwụọla n'ọgbaghara a

Ebe foto si, EPA
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị agha ruru iri na atọ so na mmadụ iri na itoolu e gburu n'ọgbaghara dapụtara n'ụbọchị ụka na mba ahụ.
Nke a mere mgbe ndị ojiegbe wakporo ọdọ ndị agha nakwa ụlọ mkpọrọ dịka ọnụ na-ekwuru ndị agha si kwuo.
Ndị mba ahụ nọ na mmachi ngagharị dịka nsogbu na-arị ibe ya elu n'isiobodo Freetown.
Minista mgbasaozi mba ahụ kwuru na mwakpo ahụ bụ ihe "a kwadoro akwado".
Otu onye ntaakụkọ BBC hụrụ ndị ji egbe n'okporoụzọ ebe ha na-ekwu na ha "ga-ekpocha" Sierra Leone.
Col Issa Bangura bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha sị na otu onye nkịtị, onye nchekwa ọzọ, onye ụweojii nakwa ndị atọ na-eme mwakpo ahụ so na ndị nwụrụ.
Ndị agha asaa ndị ọzọ merụrụ ahụ na ya bụ nsogbu.
N'ime otu mwakpo ahụ nke mere n'ụlọ mkpọrọ, ndị ụlọ mkpọrọ ruru 1,890 gbapụrụ ọsọ dịka ụlọntaakụkọ Reuters si kwuo maka akwụkwọ ha hụrụ anya.
Mwakpo a mere bụ "ezigbo mmebi", bụ ihe Minista mgbasaozi bụ Chernoh Bah gwara BBC Newsday n'ụbọchị ụtụtụ Monde dịka e buliri mmachi ngagharị.
Sierra Leone attempted coup: E tinyela mmachi ngagharị

Ebe foto si, AFP
Ọgbaghara adaala na mba Sierra Leone dịka akụkọ pụtara na-ekwu na ndịagha chọrọ iweghara ọchịchị n'ike.
Mba ahụ na-ada kata-kata ugbua dịka a na-ekwu na e nwere ndị agha a na enyo chọrọ iwere ọchịchị n' ike.
E tinyela mmachi ngagharị na Sierra Leone dịka ndị bu egbe wakporo ụlọmkpọrọ tọhapụ ndị e ji eji.
A tọhapụrụ dị e ji eji na mkpọrọ 'Central Padema Road Prison' dị na Freetown, isiobodo mba ahụ n'ụtụtụ Ụbọchịụka, dịka ndị na-arụ na mkpọrọ ahụ si gwa BBC.
Na mbụ, ndị bu egbe wakporo ogige ndịagha n'obodo ahụ.
A mabeghị ndị nga ole gbafuru mana ozi nke Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke Mba Amerịka ( US State Department ) wepụtara n'afọ 2019 nke rụtụrụ aka na ewbigara mmadụ oke n'ụlọmkpọrọ ahụ kwuru na mmadụ 2,000 nọ na mkpọrọ ahụ.

Ndi bi ebe ahụ kwuru na ha ṅụrụ ụda egbe n' ogige ndịagha nke dị nso n'obi Onyeisiala mba ahụ.
N'ozi nke o si n'ụlọ zipụta n'ụtụtụ a, Onyeisialaa Julius Maada Bio gwara ụmụamala mba ahụ na ihe nile e derela jụụ, na-anọ achọ ndị kpara arụ ahụ.
Mana onyentaakụkọ anyị nọ na Freetown kwuru na a mabeghị ka ihe siri kwụrụ kpọmkwem.
O ji ụgbọala ya gagharịa ma hụ ndịagha kwọ ngwaagha n'ụgbọala ndịuweojii, ọ hụkwara ndị ọzọ na-eti mkpụ sị na ha na-akwado, 'ikpocha Sierra Leone'.
Otu Ecowas, mba Amerịka na Briten akatọla tigbuo-zogbuo ahụ.
N'ọnwa Juun, ka a họpụtara Onyeisiala Julius Maada Bio agba nke abụọ ya.
N'ọnwa Ọgọstụ, a nwụchiri ndị mmadụ gunyere ndịagha welitere isi bụ ndị a na-ebo ebubo na ha kpara nktata ịkwatu Onyeisiala n'oche ya.
N'afọ atọ gara aga, e nwela nkwatu ọchịchị n'ike n'ụfọdụ mba gụnyere mba Guinea ha na Sierra Leone gbara agbata obi bụ ebe ndịagha nọ n'ọchịchị ugbua.









