Ka m si jiri naanị dọla ise bido ahịa nri a na-anụ aha ya na Sierra Leone

Aha onyonyo, Ka m si jiri naanị dọla 5 bido wee bụrụ ọkaibe n'isi nri na Sierra Leone
Ka m si jiri naanị dọla ise bido ahịa nri a na-anụ aha ya na Sierra Leone
John Nzeribe

John Nzeribe bụ onye Naijiria na-ere nri ndị be anyị na mba Sierra Leone. Ọ gwara BBC Igbo na mkparítaụka na ya bụ ahịa na-eweta nnukwu ego mana ọ malitere ya, n'obere oge ọ bịara obodo ahụ, o nweghị ego, nka maọbụ akaọrụ ọzọ.

Nwa amadi ahụ onye kọwara na nne ya rebiri nri n'Ariarịa Aba, kwuru n'ezie na dịka nwoke, na ya etinyeghị anya n'ọrụ nne ya na-arụ were ruo hụrụ onwe ya n' ọnọdụ nnukwu ụkọ na Sierra Leone. ihe o jiri. Gee ihe o kwuru n'uju:

E ji uchu na nje mbiri mara ndị Igbo

John Nzeribe bụ onye si Owụwa Anyanwụ Naijiria bụ mpaghara ndị e ji uchu na nje mbiri mara. Nke a na-ebuga ha na mpaghara dị iche iche n'ụwa ebe na-aga ịchọ akara aka ha nakwa ebe ha ga-aba ụba.