Ndị Igbo nọ Morocco na-agba mbọ e ji mara ndị Igbo
Anyị hụrụ ọtụtụ ụlọahịa ndị Igbo nwe na Morocco.
Otu n'ime ụlọahịa ndị a bụ ebe a na-ere nri, nke Chidinma Ani nwe.
Chidinma hụrụ na nri ndị Morocco anaghị amasị ọtụtụ ụmụ Igbo nọ na Morocco.

Ebe foto si, Morocco
Ọ hụkwara na ngwa nri e ji esi nri Igbo abụghị ihe ị ga-ahụ ebe ọbụla na Morocco.
Nke a mere o ji bute uche isi Naịjirịa atụbata ngwa nri ndị Igbo dị iche iche na Morocco.
Nke a bụ nsogbu ka o gboro ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ebe ha ga-esi egote ngwa nri ha ga-eji esi nri na-agụ ha.
Chidinma esila ebe ahụ na-enwete ego o ji elekọta onwe ya na ezinaụlọ ya. Nwafọ Igbo ọzọ anyị hurụ bụ Samson Nnaji na-akpụ isi na Casablanca, Morocco.
Samson bidoro ịkpụ isi na Naịjirịa mgbe ọ ka nọ ụlọakwụkwọ sekọndịrị n'afọ 2000.
Ọ sị na mgbe ọ nwetere onwe ya na Morocco na Disemba n'afọ 2021, ọ laghachikwa n'akaọrụ ọ mụtara n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Naịjirịa.
Ugbua, Samson enweela ụlọọrụ ebe a na-akpụ isi, na-emekwa ọfụma.
Ndụmọdụ ọ na-enye ndị mmadụ bụ na akaọrụ ọbụla ị na-eme, na-emesi ya ike, ị maghị ebe maọbụ mgbe ọ ga-abara gị uru.
Dịka ọrụ isi na-enye Samson ego, ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa na-eme isi na Morocco gwara anyị na ọrụ isi anaghị agachara ha ahịa maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị anaghị eme isi na Morocco.
Ụfọdụ n'ime ha sị na ha na-achọ ụzọ ha si alaghachite Naịjirịa.







