Etu ndị 'ụnknown gunmen' si wakpo m - Cubana Chiefpriest

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest
Onye otimkpu a ma ama bụ Paschal Okechukwu a ma dịka 'Cubana Chiefpriest' ekwuola n'ezie na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ya n'Anambara steeti dịka ọ na-aga Asaba, Delta steeti.
N' ozi o zitere BBC Igbo n'ọbaozi Instagram n'Ụbọchịụka, Cubana Chiefpriest gbara ama n'ihe iyi egwu ahụ mere ya na ndị otu ya kwuru sị, "Chukwu zọrọ ndị nke ya."
Cubana Chiefpriest kwukara n'ozi o wepụtara n'akara obaozi Instagram ya sị,
" Ọ bụghị n'Imo ka o mere dịka otu ụlọ ntaakụkọ si kwuo"
" Ọ bụ n'Anambra steeti dịka anyị na-aga ọrụ n'Asaba."
a "Nke bụ eziokwu bụ nọ dị mkpa ime mkpocha n' Ọwụwa Anyanwụ"

Ebe foto si, Cubana chiefpriest
N'ihe onyonyo fegharịrị gosiri ụgbọala ya nke mgbọegbe juru ahụ ya dịka
o nweghị onye nwụrụnụ nke o ji enwe onye merụrụ nwere onye merụrụ ahụ.
Mbọ BBC gbara ịnụta olu ndị uweojii Anambra amịtaghị mkpụrụ.
Ekwentị ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga agaghị aga oge aga.
Ọ zaghịkwanụ ozi anyị zigara ya n'ekwentị rue oge akụkọ a pụtara.
Onye bụdị 'Cubana Chiefpriest'?
A ma Cubana Chiefpriest dịka mana eziaha ya bụ Paschal Okechukwu.
Okechukwu bụ onye na-eme ihe ego ma na-egosikwa na o ji 'nkụ'.
Iji maa atụ, o nyere enyi ya nwoke bụ Obinna Iyiegbu (Obi Cubana) ehi 46 oge ọ kwara nne ya n'afọ 2021.
Akụkọ kwuru na o nwere ụgbọala ndị oke ọnụahịa dịka Rolls Royce Phantom, Toyota Prado, Mercedes Benz G-class na Range Rover.
Nwa amadị a bụ onye Umuhu Okabia dị n'Okpuru Ọchịchị Orsu n'Imo steeti na-egosikarị akụnaụba ya na soshal midia.
Cubana Chiefpriest toro n'Aba, Abia steeti ma gakwaa akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ "Federal Polytechnic Nekede'.
O bidoro ndụ ya dịka onye na-arụ akpụkpọụkwụ na otiegwu mana ọ chakeghị rue oge ọ banyere n'ọrụ otimkpu na onye na-ahazị ụlọnkwarị ndị nwere agba
Ọ malitere ịhazi ụlọọrụ nkwarị nke Cubana Group.
O mechara malite ụlọrụ nkwarị nke ya ọ kpọrọ "Club Xhrine n'afọ 2020.
Ọ lụọla nwaanyị ma jiri ụmụ nwoke abụọ.










