1968 Otuocha Market Bombing: Etu m si gbalahụ ogbunigwe a tụrụ anyị n'Agha Biafra
Phillip Okoye akọwaarala BBC Igbo ihe o ji anya ya hụ n'oge Agha Biafra mgbe a tụrụ ogbunigwe n'ahịa obodo Otuocha dị n'Aguleri n'Anambara steeti.
Maazi Okoye kwuru na ihe dịka mmadụ narị ise nwụrụ na ya bụ ọdachi ma kọwaa na ọ maghị na ọ ga-ejinwu isi ya pụta n'ihe ahụ.
Mgbe BBC gara na nke ya, ọ kpọọ anyị gaa n'ahịa Otuocha ahụ ịhụ etu ọ dịzi ugbua dịka afọ iri ise na anọ gachara.
O kwuru na ezinaụlọ ya so na ndị nwereike ịzọ isi onwe ha mgbe ndị agha Naịjirịa na-atụ ya bụ ogbunigwe n'obodo ha.

Nwanne ya bụ Peter Okoye sokwa kọọ ihe mere mgbe ahụ mgbe ọ sị na ọ bụghị naanị otu oge ka a tụrụ Ogbunigwe n'obodo ha.
O kwuru si, "Ha laghachichaa, o rue ihe dịka mgbe izuụka abụọ gachara, ụgbọelu ndị ahụ abịakwa ọzọ"
Phillip n'onwe ya kọrọ na mgbe ọ gara ichu mmiri na o nwere otu onye agha bịara gwa ha na ha hụ ụgbọelu abụo na-eso onwe ha, ha gbaba ọsọ n'ihi na ọ bụ ogbunigwe ka ha chọrọ ịtụ.
Gee ihe ha gwara anyi n'uju ebe a:

Maazi Okoye kwuru na ihe ruru mmadụ narị ise nwụrụ n'ogbunigwe ndị ahụ a tụrụ ha.
Akụkọ sị na Otuocha so n'ọtụtụ ebe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ebe ndị agha wakporo ndị Igbo kachasị n'oge Agha Biafra.


