Ernest Okonkwo: Ihe ndị mmadụ ejịghị echefụ Ernest Okonkwo, ọkpọka 'football commentator' larala mmụọ

Aha onyonyo, Ernest Okonkwo: Ihe i kwesiri ịma maka onye ntaakụko egwuregwu a pụrụiche

Ernest Okonkwo bụ onye ntaakụkọ egwuregwu wuru ewu ọfụma n'agbata afọ 1970s na 1980s oge ọ nọ ndụ maka etu o si agba ozi egwuregwu na Redio Naịjirịa.

Ka oge na-aga, ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasi ọfụma na Naịjirịa ka na-echeta Maazị Okonkwo maka etu ọpụrụiche o si agbasa ozi ya.

Aha onyonyo, Chioma Ajunwa: "Ọ bụrụ na e nyere m ohere inye ndị 'athletes' ọzụzụ ihere akaaraghị eme Na

Ọtụtụ na-ekwu na enweghị onye ọzọ dị ka nwoke ahụ baara ọtụtụ ndị egwu bọọlụ kpara ike n'agbata 70s na 80s aha dịka 'Mathematical Segbun Odegbami', 'Chairman Christian Chukwu, Emmanuel Ọkala 'Man Mountain' bụ aha a na-etu ha ruo ugbua.

Ernest Okonkwo, onye Nando n'Anambara steeti nwụrụ n'abalị Asaa nke ọnwa Ọgọstụ,afọ 1990 ka ọ gbachara afọ 54.

Ọ hapụrụ nwunye, na ụmụ ise mana nwunye ya mechara nwụọ n'afọ 2005 ka ọ gachara afọ 15.

Nwa nwaanyị, Barr Amaka Okonkwo-Oboh, na-agbasotụ nzọụkwụ site ịbụ ọkaiwu iwu gbasaara egwuregwu were anya.

Akụkọ kowara maka ya ọfụma.

Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Chiemela Mgbeahụrụ.