Kelechi Iheanacho: Kedụ etu o si bụrụ ụkwụ na-aghọ nkọ?

Kelechi Iheanacho

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Kelechi Iheanacho enyela goolu 14 n'ime asọmpi 14 ikpeazụ ọ gbarala Leicester City
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kelechi Iheanacho chere ruo ụbọchị atọ nke ọnwa Febrụwarị iji nye goolu mbụ ya na Premier League n'afọ bọọlụ ọhụrụ a.

Kemgbe ahụ Iheanacho na-agbara Leicester City enyela goolu 12 n'ime asọmpi itoolu ọ gbarala ha.

Nwaafọ Naịjiria a na-akpọ 'senior man' haziri goolu nke mbụ ma nye nke abụọ ha ji merie Crystal Palace satara naanị otu, iji nyekwuo ha pọịntị asaa ha ji aga ndị na-eso ha n'azụ na tebulu ma nyekwuo ha ohere irute nso maka ntozu asọmpi Champions League.

Nke a egosila Iheanacho dị iche na Iheanacho chere ọnwa 14 tupu otu goolu na Premier League site n'ọnwa Septemba 2018 ruo Disemba 2019.

Ọ bụrụla onye kacharala nyere ndị Leicester City goolu na sizin a dịka o nyerela goolu 17, nke bụ kemgbe afọ 2014-2015 Jamie Vardy nọ na nsogbu ịbụ onye na-abụghị onye bu ụzọ.

"Anyị anaghị akpa maka onye ga-abụ onye kacha nye goolu," ka Iheanacho gwara BBC Sport. "Dịka otu anyị na-arụkọtara onwe anyị ọrụ, onye nyere goolu agbasaghị anyị.

"E nwere ọtụtụ ihe a ga na-agbanwe ka ọ kakwuo mma n'asọmpi anyị na-agba, ya mere m ga na-aga n'ihu, na-agbasi mbọ ike."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Brendan Rodgers bụ onye nchịkọta ya kwuru: "Kemgbe ọnwa ole na ole, Kelechi na-eme ihe dị egwu. Ọ bụghị naanị ebumnobi ya kama ọ bụkwa etu o si etinye uchu n'ọrụ, ọ chọrọ igosi ndịiche n'egwuregwu. Ọ bụghị onye okomoko ma ncha, ọ na-agbasikwa mbọ ike."

Gịnị gbanwere?

Kelechi Iheanacho na Jamie Vardy

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Kelechi Iheanacho na Jamie Vardy abụrụziela nhatanha kama ịbụ onye na-eṅomi ya

Ihe gbanwere kemgbe Iheanacho malitere ịgbara Leicester City bọọlụ, bụ na ya na Vardy na-arụkọzị n'ihu.

Naanị egwuregwu asatọ ka ha abụọ so malite n'afọ bọọlụ gara aga, mana ha abụọ agbakọghị ọnụ ọzọ n'afọ bọọlụ ọhụrụ a ruo Febrụwarị 28 - ọ bụkwanụ naanị makana James Maddison na ndị ọzọ merụrụ ahụ. Ha agbakọkwaalanụ egwuregwu ndị ọzọ ọnụ kemgbe ahụ.

Iheanacho enyela goolu 14 n'ime ugboro 14 ikpeazụ ọ gbara bọọlụ, nke bụ ole ọ kacharala nye n'ime ugboro 76 mbụ ọ gbarala ndị Leicester.

Naanị Harry Kane (nwere goolu 18) enyela goolu karịa Iheanacho (nyerela goolu 15) n'ime ndị na-agba bọọlụ na Premier League n'asọmpi niile n'afọ a.

Karen Carney gbabuuru Ịngland bọọlụ dịka ọ na-ele egwu dị n'etiti Leicester City na Crystal Palace, gwara BBC Radio 5 Live sị: "Ọ dị m ka obisiike Iheanacho abịala n'ihi na ọ ma na agaghị ewepụ ya tinye Vardy mgbe ọ na-agba bọọlụ.

"Dịka onye na-agba bọọlụ, ị ga-ahụ na ọ ga na-echekasị gị na e nwere ike ịwepụ gị n'egwu.

"Mana n'ihi na ya na Jamie Vardy na-agbakọ ọnụ, obi kara ya, otu goolu ahụ amụbanye n'abụọ na atọ."

Rodgers bụ onye nchịkọta ya kwuru: "Ihe kacha m mkpa dịka onye nchịkọta bụ inyere ndị ọgbabọọlụ aka ime ọfụma karịa etu ha dị. Ọ rara Kels ahụ n'ihi etu anyị si agbabu bọọlụ nke bụ iji naanị otu onye goolu - Jamie Vardy.

"Anyị gbanweziri ya n'ihi ndị merụrụ ahụ, chi ya efoola ugbua ọ na-aghọkwanụ nkọ. Ọ bụghị naanị goolu ọ na-enye, ọ na-enye ya aṅụrị itinye uchu n'ọrụ otu a."

Kelechi Iheanacho so bido n'egwuregwu ugboro abụọ ha zutere Crystal Palace n'afọ bọolụ ọhụrụ a. Mgbe ha zutere na Disemba (n'aka ekpe) naanị ugboro 22 ka ụkwụ ya metụrụ bọọlụ, o rikwara penariti tupu e wepụ ya tinye Vardy. Mana na mmeri nke ụbọchị mọnde, o nyere goolu, haziere onye ọzọ ma metụkwa bọọlụ ụkwụ ugboro 46

Ebe foto si, Opta

Nkọwa foto, Kelechi Iheanacho so bido n'egwuregwu ugboro abụọ ha zutere Crystal Palace n'afọ bọolụ ọhụrụ a. Mgbe ha zutere na Disemba (n'aka ekpe) naanị ugboro 22 ka ụkwụ ya metụrụ bọọlụ, o rikwara penariti tupu e wepụ ya tinye Vardy. Mana na mmeri nke ụbọchị mọnde, o nyere goolu, haziere onye ọzọ ma metụkwa bọọlụ ụkwụ ugboro 46

Ezigbote onye goolu

Iheanacho ezila na ọ ga-enyenwu goolu nso nso a, n'ụzọ a na-anaghị ahụkarị kemgbe ọ gbawara bọọlụ.

Goolu 10 o nyere na Premier League n'afọ a agafeela goolu ndị a na-atụkarị anya n'aka ya - goolu ole a na-atụ anya na ọ ga-enye site n'ohere ndị ọ na-enweta - ji goolu atọ gafee, shọt ole ọ gbara pụtara ihe bụ nke kachasị kemgbe o sonyere Leicester City.

Kasper Schmeichel bụ oche goolu ndị Leicester City gwara Sky Sports: "Ihe gbasara inye goolu doro Kele anya ọfụma - ọ ma etu ọ ga-esi nọgharịa ma gbaa bọọlụ ozugbo, o nwere nke ọ na-eme ebe ọ na-anọgharị wee si n'etiti ụkwụ onye egwu azụ gbafere bọọlụ ma bie oche goolu aka n'ala.

"Ọ na-emekarị ya mgbe ọbụla ma anyị nọrọ n'ọzụzụ. Ikwu nke bụ eziokwu, ọ na-eyi ndị mmadụ egwu n'ọzụzụ. Ọ bụ dimkpa siri ike na-emegharịnwu ahụ, ọsọ dị ya n'ụkwụ, o nwere ihe niile mmadụ na-eji abụ ezigbote onye goolu ma na-egosikwanụ ya ugbua, nke bụ ezigbo ihe."