Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya
Ọ bụ eziokwu na Robert Mugabe onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe anwụọla mana nzọụkwụ ọ hapụrụ na ndụ a bụ ihe a ga-eji cheta ya.
Ọ nwụrụ na mba Sịngapọ bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ kamgbe ọnwa Epurel dịka ezinaụlọ ya gwara BBC.
Mugabe meriri na ntuliaka mbụ ndị mba Zimbabwe mere mgbe ha si n'aka ọchịchị mba Briten pụta, wee bụrụ Praịm Mịnịsta n'afọ 1980.
Ihe ise ikwesiri ịma maka Mugabe:

Ebe foto si, AFP
- A mụrụ Mugabe na 21 Febụwarị, afọ 1924 n'ime ezinaụlọ Shona bụ ndị dara ogbenye, n'obodo Kutama dị na Southern Rhodesia.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Kutuma College nakwa Mahadum Forte Hare.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nkuzi na Southern Rhodesia, Northern Rhodesia na Ghana.
- Ọ bụ ya malitere ịkpọ oku ka mba Zimbabwe nwere onwe ya site n'ịba n'otu 'African National Protest'
- Ọ gara mkpọrọ n'afọ 1964 ruo 1974 maka ikwu okwu ọjọọ megide gọọmentị na-achị mgbe ahụ.
- O so lụọ agha 'Rhodesian Bush War' mgbe ọ hiwere otu ZANU.
- Agha a biri n'afọ 1980 nke mere e ji mee ntuliaka nyere Mugabe mmeri dịka Praịm Mịnịsta mbụ nke mba Zimbabwe.
- O mechara werezie ọchịchị n'uju dịka onyeisiala mba Zimbabwe.
- Ọ nọrọ n'ọchịchị rue afọ 2017 mgbe e che na ọ chọrọ ka nwunye ya bụ Grace nọchie ya n'ọkwa. Nke a mere ndị agha jiri chụtuo ya n'ọkwa ọchịchị ọ nọrọla ihe karịrị afọ iri atọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: