Etu ikpe gbasara ịkpọ Ipob otu oyi ndụ egwu si gaa n’Abuja n'Oktoba12, afọ 2022

Ebe foto si, BBC/Getty Images
Otu onye n’ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor akọwarala BBC Igbo etu ikpe ha bugaara ụlọikpe mkpeghara nke Abuja siri gaa taa bụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọktoba.
O kwuru na eyigharịrị ụbọchị ikpe ahụ gaa ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị, 2023 n’ihi ọkaikpe atọ nọ n’isi ya bụ ikpe abịaghị ụlọikpe taa.
Ejimakor kọwara na ya bụ ikpe agbaala afọ n’aka ụlọikpe ahụ dịka e bugara ya ebe ahụ n’afọ 2018.
Cheta na n’ọnwa Sepụtemba afọ 2017 na Gọọmentị Naịjirịa kpọpụtara aha otu Indigenous People of Biafra (Ipob) dịka otu oyi ndụ egwu.
Ejimakor kọwara na ha mere mkpesa ọhụrụ ka etinye aha Kanu n’okwu mkpeghari a n’ihi ya bụ ebubo gọọmentị Naịjirịa na-ebo Ipob metụtara ya dịka onyendu otu ahụ.
O kwuru “Akụkụ akara 243 n’iwu Naịjirịa kwadoro ka e tinye aha Kanu ma hụ na ọ bịara zara ọnụ ya n’ihi ya bụ okwu emetụtala ya dịka a nwụchiri ya ma na-ebo ya ebubo metụtara iyi ndụ egwu ugbua”

Ebe foto si, Getty Images
Chukwuma-Machukwu Ume bụ ọkaiwu Kanu sokwa bịa ikpe ahụ kwuru na ha na-eme mkpesa mkpegharị a maka na gọọmentị Naịjirịa mere ya bụ mkpọpụta aha Ipob dịka otu oyindụ egwu ma ha akpọghị Kanu ka ọ bịa zara ọnụ otu ahụ. O kwuru na nke a megidere ikike dịrị ya.
Ejimakor gara n’ihu kọwa na dịka Kanu ka nọ n’aka ndị ngalaba uweojii Naịjirịa pụrụiche bụ Department of State Services (DSS) kemgbe afọ 2021 na ikpe ọbụla metụtara ya kwesịrị ịbụzi ihe a na-ekpe ngwa ngwa n'ihi oge agaala.
Ejimakor kwuru “Dịka eyigharịrị ikpe a gaa afọ 2023, e zigaara m ụlọikpe ahụ akwụkwọ mkpesa ngwa ngwa gwaa ha na ya bụ ụbọchị e buuru ya gaa ezighi ezi ma ncha n’ihi oge ahụ dị ezigbo anya.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụrụ na ha enweteghi mmeri n’ikpe a na ha ga e buru ya gaa ụlọikpe kachasị dịka ha wetesiri ike na Ipob nakwa onyendu ha bụ Kanu enweghi aka n’okwu iyi ndụ egwu ọbụla.

Cheta na a na-ekpe ikpe Nnamdi Kanu n’ụlọikpe ukwu nke Abuja dịka gọọmentị Naịjirịa boro ya ebubo 15 nke e mechara kụchapụ asatọ n’ime ha.
Ebubo ndị a gụnyere iyi ndụ egwu, ikpa nkata ịkụsa ọchịchị Naịjrịa, inye iwu ka awakpoo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa nakwa ebubo ndị ọzọ.
E yigharịrị ikpe nke a nọ n’ụlọikpe ukwu nke Abuja gaa ụbọchị amabeghị dịka ọkaikpe Jummai Hanati kwuru n’ọnwa Sepụtemba na ọ ga-ezitere ndị ya ikpe metụtara ozi ụbọchị a ga-ekpezi ya bụ ikpe.









