Etu Buhari, Neymar, Mbappe, Ronaldo na ndị ọzọ si akwanyere Pele ugwu

Ụwa niile adaala juu dịka a na-akwanyere Pele ugwu dịịrị ya.

Ebe foto si, Getty Images

Oke osisi dara n’ụwa n’ụbọchị Tọọzde dịka ọkaibe n’egwu bọọlụ nke mba Brazil bụ Pele lara mmụọ.

Ọtụtụ ndị welitere isi n’ụwa amalite izipụta ozi nkwanye ugwu nye nakwa ndụ o biri.

Nyemar nke mba Brazil kwuru na ‘Eze’ Pele ‘Gbanwere ihe niile’ oge o kwuru okwu banyere ndụ ya nakwa etu o siri metụta egwu bọọlụ.

Aha onyonyo, Etu Buhari, Neymar, Mbappe, Ronaldo na ndị ọzọ si akwanyere Pele ugwu

O kwuru “Ọ gbanwere ya egwu bọọlụ ka ọ bụrụ ihe nkiri, ihe egwuregwu obi ụtọ. O ji egwu bọọlụ nyere ndị na-eweghị ka ọhara ha aka nakwa ndị isi ojii”

Ọgba bọọlụ Kylian Mbappe nke mba France dere n’akara soshal midia ya na Pele bụ ‘Eze egwu bọọlụ’, “Agaghị echefu ụkpụrụ ya”.

Pele onye mere ihe e metubeghị mgbe dịka ọgbanyere nchịkọta goolu 1281 n’egwu bọọlụ 1362 o sonyere n’afọ 21 ọ gbara bọọlụ.

Ọ gbanyere mba ya goolu 77 n’ime egwu bọọlụ 92 o sonyere gbaa.

Pele bụ naanị onye bọọlụ ritere ma bulie iko mba ụwa ugboro atọ nke mere n’afọ 1958, 1962 na 1970.

N’afọ 200, otu nhazi egwu bọọlụ ụị̀a bụ Fifa họpụtara ya dịka onye kacha n’egwu bọọlụ na nchịkọta afọ 100.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post, 1

Cristiano Ronaldo nke mba Portugal dere:

“I si Eze Pele ‘Ka ọ dị zie’ nkiti agaghị ezu oke na ngosi ihe mgbu ji ndị egwu bọọlụ n’ụwa aka ugbua”

O kwuru “Agaghị echefu ihe o mere na ndụ anyị niile egwu bọọlụ na-amasị”.

Ronaldo nke mba Brazil kwupụtara na Pele bụ ‘Ọ pụrụiche, ọkaibe, onye isi na-acha ọkụ nakwa onye na-enweghị ntụpọ.”

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Instagram post, 2

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana ọ bụghị naanị ndị egwu bọọlụ bụ ndị na-akwanyere ya ugwu a, Onyeisiala Muhammdu Buhari ezipụla ozi maka ọnwụ ya ma kwuo na ụwa agaghị echefu ya ọkachasị etu o siri rụọ ọrụ ikpe udo na ịjịkọ agbụrụ na okpekerechi dị iche iche n’ụwa.

Akara Twitter gọọmentị mba Brazil dere “Dike anyị” ga-abụ onye “anyị agaghị echefu echefu n’ụwa a”.

Onyeisiala Joe Biden nke mba Amerịka kwuru “N’egwu bọọlụ a na-akpọkọta ụwa niile ọnụ, etu Pele siri rie elu agbanyeghị n’ọnọdụ dị ala ebe o siri pụta bụ ihe gosiri na enweghị a na-apụghị ime.”

Onyeisi otu nhazi bọọlụ Fifa bụ Gianni Infantino kwuru na obi gbawara ya dịka ọ kọwara na “ihe bụ ụbọchị dị oke egwu nye egwu bọọlụ n’ụwa”.

Ọkaibe n’egwu ịgba ọsọ bụ Usain Bolt depụtara na Pele bụ “onye egwuregwu nọ agaghị echefu echefu”.

Nwa ya nwaanyị bụ Kely Nascimento zipụtara foto gosiri ihe dịka aka Pele mgbe ọ nọ n’ụlọọgwụ ma kwuo:

“Anyị na-eleke gị n’ihi ihe ọbụla anyị bụ taa bụ maka gị, anyị hụrụ gị n’anya, laa na ndokwa”.

N'akụkụ ụwa dị iche iche amalitela itinye ihe nka, foto nakwa ihe ndị ọzọ na-egosi nkwanye ugwu pụrụiche nye Pele.

Mba Brazil ewepụtala abalị atọ iji ruo uju ma kwanyere ya ugwu dịịrị ya dịka ọ kwalitere aha mba ahụ ụzọ ọma nakwa egwu bọọlụ ha n'ụzọ pụrụiche.

Akụkụ ụwa dị iche iche amalitela igosi ihe nkwanye ugwu nye Pele

Ndị mmadụ na-esete foto gosiri ihu Pele n'otu ụlọ na Sao Paulo, Brazil

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-esete foto gosiri ihu Pele n'otu ụlọ na Sao Paulo, Brazil
Mba Brazil ji ọkụ na-acha ka ọla edo gosi nkwanye ugwu nye Pele n'ama egwu egwu Maracana

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Mba Brazil ji ọkụ na-acha ka ọla edo gosi nkwanye ugwu nye Pele n'ama egwu egwu Maracana
Mba Brazil ji agwa ọkọlọtọ mba ha chakwasị ọkụ n'elu ihe akpụrụ akpụ e ji mara mba ha na Rio de Janeiro

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Mba Brazil ji agwa ọkọlọtọ mba ha chakwasị ọkụ n'elu ihe akpụrụ akpụ e ji mara mba ha na Rio de Janeiro
A na-egosi foto nkwanye ugwu n'elu ahụ otu ụlọ na Paraguay

Ebe foto si, Getty Images