World Cup Final 2022: Gịnị ka uwe ojii Emir Qatar yinyere Messi pụtara?

Ebe foto si, Getty Images
N'abalị ụbọchị Sọnde, Disemba 18 2022, nrọ Lionel Messi malitere ịrọ kamgbe ọ bụ nwata bịara na mmezu: mba ya bụ Ajentịna buliri iko mba ụwa.
Nke a bụ iko mbaụwa nke mbụ Messi na-ebuli, ma bụrụkwa nke mbụ Ajentịna na-ebu kamgbe afọ 36 gara aga.
Mana tupu Messi ebulie iko ahụ, Emir nke Qatar bụ Sheikh Tamim bin Hamad Al Thani yinyere ya otu uwe ojii e jiri ọlaedo gbaa ya gburugburu.
Ọtụtụ mmadụ na-ajụ ihe ya bụ uwe ojii pụtara nakwa ihe mere e ji yinye ya Messi.
Hassan Al Thawadi, bụ odeakwụkwọ nke otu haziri Iko Mbaụwa nke afọ 2022, kọwara aha uwe ojii ahụ n'asụsụ Arabic bụ 'Bisht'.
"Ọ bụ uwe pụrụ iche a na-eyi n'oge mme. Ihe e ji yinye Messi uwe ahụ bụ iji kwanyere ya ugwu na mmeri ya," Al-Thawadi kọwara.
"Iko Mbaụwa bụ ohere anyị nwere iji gosi ụwa niile omenala ndị Arab nakwa okpukperechi Muslim. Ọ bụghị naanị maka mba Qatar. Ọ bụ iji gosi aṅụrị jupụtara na mpaghara anyị niile."
Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia gbasara nke a

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye mgbasaozi na mba Ireland aha ya bụ Jonny Ward kwuru na iyinye Messi uweojii nke mechiri akara uwe ya bụ 10, bụ nnukwu ihe mkparị.
Onye ọzọ aha ya bụ Baluma na Twitter dere sị: "Uwe ojii ahụ bụ otu ihe mebiri ihe niile dịka Messi buliri iko mba ụwa".
Adi Shah dere sị: "Onwere onye ga-ewepụ uweojii a n'ahụ Messi na foto a?"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana enwekwara ndị dere na uwe ojii ahụ bụ nkwanye ugwu, ọ bụghị mkparị.
Firas Abu bụ onyeisi ụlọọrụ ntaakụkọ Arabic 21, kwuru na "ọ bụ ndị ntaakụkọ si mpaghara Ndịda na-akatọ onyinye Bisht nke e nyere Messi."
Onye ọzọ bụ Mohammed Mutahir Ali kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ ụzọ ha ga-esi na-akatọ Qatar.
Cheta na Lionel Messi nwetakwara nturuugo nke onye kacha gbaa bọọlụ n'asọmpi iko mba ụwa 2022.
Mbappe natara nturuugo onye kacha nye goolu (goolu asatọ), ebe Emiliano Martinez nke Ajentịna nwetara nturuugo onye ochee bọọlụ kacha mee ọfụma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









