World Cup Qatar 2022: Lee ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ asọmpi a ga-abụ nke ikpeazụ ha

Ebe foto si, Ronaldo/Messi/Suarez/Instagram
Asompi iko mba ụwa nke afọ 2022 ga-amalite echi bụ Nọvemba 20 na mba Qatar.
Maka ụfọdụ ndị a ma ama n'egwuregwu bọọlụ, nke a ga-abụ nke ikpeazụ ha ga-esonye n'asọmpi a tupu ha alaa ezumike nka.
N'ihi nke a, ajụjụ ọtụtụ na-ajụ bụ, "kedụ onye n'ime ndị a ama ama ga-ebuli iko mba ụwa nke afọ 2022 tupu ọ na-awụsa ọwa n'ịgba bọọlụ"?
Lee ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ ga-efere ụwa 'bye bye' na Qatar 2022:
Cristiano Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images
Mgbagha adịghị ya na nke a ga-abụrịrị asọmpi iko mba ụwa nke ikpeazụ Ronaldo ga-eso mba ya bụ Pọtụgal gbaa, tupu ọ kwụsị ịgba bọọlụ.
Oge ọzọ a ga-enwe asọmpi iko mba ụwa na 2026, Ronaldo ga-adị afọ 41, mgbe ahụ ike agaghịkwa adị ya ịgba bọọlụ dịka o si eme ugbua.
Iko mba ụwa nke afọ a ga-abụ nke ugboro ise Ronaldo na-esonye na ya; ọ gbaala asọmpi 19 ma nye goolu 15 n'asọmpi iko mba ụwa, mana ngụkọta goolu niile o nyerela dịka ọgba bọọlụ akarịala 700.
Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ na-ekwu na ihe mere e ji ahụta Diego Maradona dịka ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ na mba Ajentịna bụ maka na Lionel Messi ebulibeghị iko mba ụwa.
Ọ bụrụ na Messi nyere Ajentịna aka bulie iko mba ụwa nke afọ 2022 na Qatar, onweghị onye ga-agbagha na ọ bụrụla ọkaibe n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile.
Dịka Ronaldo, nke a bụkwa iko mba ụwa nke ise Messi ga-esonye na ya; o kwukwaala na ọ ga-abụ nke ikpeazụ ya.
Na 2014, ọ fọdụrụ obere ka Messi bulie iko mba ụwa, mana Germany ji otu ọkpụ goolu merie Ajentịna n'asọmpi ikpeazụ.
Ọtụtụ ndị nkwado Messi na-enwe nchekwube na ọ ga-eji iko mba ụwa nke afọ 2022 wee laa ezumike nka.
Messi ga-adị afọ 39 n'afọ 2026, o kwukwaala na nke a ga-abụ iko mba ụwa nke ikpeazụ ya.
Rober Lewandoski

Ebe foto si, Getty Images
Lewandoski dị afọ 34 ugbua, nke pụtara na ọ ga-adị afọ 38 n'oge a ga-enwe asọmpi iko mba ụwa nke 2026.
Nwa amadị a agbaarala otu bọọlụ dị icheiche dịka Borussia Dortmund, Bayern Munich na Barcelona; o nyekwala goolu karịrị 500 kamgbe ọ malitere ịgba bọọlụ.
Ọ gbaarala mba ya bụ Poland bọọlụ ugboro 134 ma nyere ha goolu 76.
Luis Suarez na Edinson Cavani

Ebe foto si, Getty Images
Suarez na Cavani dịcha afọ 35 n'otu n'otu.
A na-atụ anya na Qatar 2022 bụ asompi iko mba ụwa nke ikpeazụ ha ga-agbara mba ha bụ Uruguay tupu ha awụsa ọwa.
Ha abụọ na-agba ihu, ma bụrụkwa ndị nyerela mba ha ọtụtụ goolu n'egwuregwu bọọlụ. Qatar 2022 ga-abụ iko mba ụwa nke anọ ha abụọ na-agbara Uruguay.
Suarez gbaara otu Liverpool, Barcelona nakwa Atletico Madrid, ebe Cavani gbara na Napoli, PSG, na Manchester United.
Otu ihe a ga-eji cheta Suarez n'asọmpi iko mba ụwa bụ oge o ji aka kụpụ bọọlụ na-achọ ịbanye na goolu, n'asọmpi Uruguay na Ghana, n'iko mbaụwa nke 2010 na Saụt Afrịka.
E nyere Suarez 'red card' maka nke a, mana Asamoah Gyan gbafuru penariti so ya n'azụ, nke mere Ghana ji pụọ na ya bụ asọmpi.
Karim Benzema

Ebe foto si, AURELIEN MEUNIER
Qatar 2022 nwereike ịbụ iko mba ụwa ikpeazụ nke Benzema ga-eso Fransị gaa, maka na ọ ga-adị afọ 39 mgbe iko mba ụwa ọzọ.
Benzema esoghi n'otu Fransị ndị buru iko mba ụwa n'afọ 2018, n'ihi ebubo gbasara onyonyo aramara e boro ya n'oge ahụ nke mere e ji gụpụ ya.
Mana na nke ugbua, Benzema, onye a họpụtara dịka onye kacha agba bọọlụ n'ụwa n'afọ 2022, ga-enwe olileanya ibuli iko mba ụwa otu ugboro tupu ọ wụsa ọwa.
Manuel Neuer

Ebe foto si, Getty Images
Manuel Neuer so na ndị enwereike ịkpọ ochee bọọlụ kacha ibe ya n'ụwa.
O so mba Germany bulie iko mba ụwa nke afọ 2014, mana ọ ga-adị afọ 40 na 2026.
A na-atụ anya na nke a nwereike ịbụ iko mba ụwa ikpeazụ Neuer ga-agba, mana ụfọdụ na-ekwu na o nwekwara ike isonye n'asọmpi a, maka na enweela ndị ochee bọọlụ isii gbarala iko mba ụwa oge ha gaferela afọ 40.
Luka Modric

Ebe foto si, Lukamodric10/Instagram
Modric bụ onye ndu ndị otu bọọlụ Croatia n'afọ 2018 oge ha ruru agba nke ikpeazụ n'asọmpi iko mba ụwa nke afọ ahụ, mana mba Fransị meriri ha.
A na-atụ anya na Modric agaghị abịazi iko mba ụwa ọzọ maka na ọ ga-adị afọ 41 n'afọ 2026.
Mdric agbaarala otu Real Madrid bọọlụ ihe karịrị ugboro 400, ma bukwaa ọtụtụ iko.
Gareth Bale

Ebe foto si, Huw Evans Picture Agency
Nke a bụ iko mba ụwa nke mbụ Gareth Bale ga-eso mba ya bụ Wales gbaa, o nwekwara ike ịbụ nke ikpeazụ.
Bale dị afọ 33 ugbua, nke bụ na ọ ga-adị 37 mgbe a ga-enwe iko mba ụwa ọzọ na 2026, mana ike ya n'ịgba bọọlụ na-agbadazi agbada.
Ọzọkwa bụ na nke a bụ iko mba ụwa nke mbụ mba Wales na-etozu isonye na ya kamgbe afọ 1958, nke mere ka ọtụtụ na-ekwu na amabeghị mgbe ha nwereike itozu isonye n'iko mba ụwa ọzọ ma Qatar 2022 gachaa.
Sergio Busquets

Busquets so n'otu bọọlụ mba Spen nke buliri iko mbaụwa na Saụt Afrịka na 2010.
O so na ndị ọkaibe n'ịgba etiti n'egwuregwu bọọlụ n'ụwa niile, mana ọ dị afọ 34 ugbua, ike ya adịghịkwa etu ọ dịbu, nke pụtara na o nwere ike ịwụsa ọwa tupu afọ 2026.
Neymar

Neymar da Silva Santos Junior bụkwa onye ọzọ a ma ama n'egwuregwu bọọlụ nwereike ịwụsa ọwa tupu asọmpi iko mba ụwa nke afọ 2026.
"Ana m eche na nke a bụ iko mba ụwa nke ikpeazụ m ga-agba," Neymar gwara ndị ntaakụkọ n'afọ gara aga. Mana o mechara kwuo na nke ahụ abụchaghị ihe o bu n'uche.
Neymar dị afọ 30 ugbua, nke pụtara na ọ bụrụ na ọ chọọ, ma gbasie mbọ ike, o nwereike iso gbaa asọmpi nke afọ 2026 ga-adị na mba Amerịka, Kanada na Meziko.









