Etu ụlọụka si kagbuo agbamakwụkwọ n'ihi na nwaanyị di ime

Israel Kennedy na Rose

Ebe foto si, Family

Otu ụlọụka awụla di na nwunye kwesịrị ịgba akwụkwọ ụnyahụ n'ala dịka ha kagburu emume ahụ n'ihi nchọpụta na nke nwaanyị di ime.

Israel Kennedy na Rose kwesịrị ịgba akwụkwọ Ụbọchịọụka, abalị 26 nke ọnwa Novemba, afọ 2023 mana nnyọcha nke otu ụlọụka dị n'15B Ikot Ekpene Road Aba, Abia Steeti mere gosiri na nwaada ahụ di ime nke mere ka ndịisi ụka ahụ kagbuo agbamakwụkwọ ahụ.

Ụka ahụ bụ ụka ọgbaraọhụrụ nwere iwu na di na nwunye kwesịrị idowe onwe ha ọcha, ghara idina tupu agbamakwụkwọ.

Otu onye ezinaụlọ ha achọghị ka a kpọọ aha ya gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ ka ọ fọrọ awa 24 tupu mmemme agbamakwụkwọ "ka a chọpụtara na ọ dị ime ,were maa ọkwa na a kagbuola agbamakwụkwọ ahụ".

Akụkọ kwukwara na a mapụrụ di na nwaanyị ahụ nwa mgbe nta dịka iwu na omenala ụka ahụ siri dị.

Akụkọ ka na-abịa.